Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 69

Nna Ha Ọ̀ Bụ Ebreham Ka Ọ̀ Bụ Ekwensu

Nna Ha Ọ̀ Bụ Ebreham Ka Ọ̀ Bụ Ekwensu

JỌN 8:37-59

  • NDỊ JUU EKWUO NA EBREHAM BỤ NNA HA

  • TUPU A MỤỌ EBREHAM, JIZỌS ADỊRỊLA NDỤ

Jizọs ka nọ na Jeruselem na-akụziri ndị mmadụ eziokwu dị mkpa. Ọ bịara Jeruselem maka Ememme Ụlọikwuu (nke a na-akpọkwa Ememme Ụlọ Ndò). Ọ dịbeghị anya ụfọdụ ndị Juu, bụ́ ndị bịara ememme ahụ, gwara ya, sị: “Anyị bụ ụmụ Ebreham, anyị abụtụbeghị ohu.” Jizọs gwara ha, sị: “Amaara m na unu bụ ụmụ Ebreham; ma unu na-achọ igbu m, n’ihi na okwu m adịghị arụpụta ihe ọ bụla n’etiti unu. Ihe m hụrụ n’ebe Nna m nọ ka m na-ekwu; ya mere, na-emenụ ihe unu nụrụ n’ọnụ nna unu.”—Jọn 8:33, 37, 38.

Ihe Jizọs na-ekwu doro anya. Ihe ọ na-ekwu bụ na Nna ya dị iche ná nna ha. Ndị Juu aghọtaghị ihe okwu Jizọs pụtara. N’ihi ya, ha kwughachiri ihe ha kwuru. Ha sịrị ya: “Nna anyị bụ Ebreham.” (Jọn 8:39; Aịzaya 41:8) Nke bụ́ eziokwu bụ na ha si n’agbụrụ Ebreham. N’ihi ya, ha chere na ha na-efe Chineke ahụ Ebreham, bụ́ enyi Chineke, fere.

Ihe Jizọs gwara ha juru ha anya. Ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebreham, na-arụnụ ọrụ Ebreham rụrụ.” N’eziokwu, nwa kwesịrị ịna-akpa àgwà ka nna ya. Jizọs gwakwara ha, sị: “Ma ugbu a, unu na-achọ igbu m, bụ́ onye gwara unu eziokwu nke m nụrụ n’ọnụ Chineke. Ebreham emeghị otú a.” Jizọs gwaziri ha ihe gbara ha gharịị. Ọ sịrị ha: “Unu na-arụ ọrụ nna unu.”—Jọn 8:39-41.

Ndị Juu amaghị onye Jizọs na-ekwu na ọ bụ nna ha. Ha kwuru na ha bụ ezigbo ụmụ Ebreham. Ha sịrị: “Anyị abụghị ndị a kwatara n’iko; anyị nwere otu Nna, ya bụ, Chineke.” Chineke ọ̀ bụnụ Nna ha? Jizọs gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m n’anya, n’ihi na esi m n’ebe Chineke nọ bịa, m wee nọrọ n’ebe a. Abịaghịkwa m n’uche nke aka m ma ọlị, kama ọ bụ Onye ahụ zitere m.” Jizọs jụrụ ha ajụjụ ma zaa ya n’onwe ya. Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị mere na unu amaghị ihe m na-ekwu? Ọ bụ n’ihi na unu apụghị ige ntị n’okwu m.”—Jọn 8:41-43.

Jizọs agbalịala ime ka ha mata ihe ga-eme ha ma ha jụ ya. Ọ gwaziri ha hoo haa, sị: “Unu sitere ná nna unu bụ́ Ekwensu, unu na-achọkwa ime ihe nna unu chọrọ.” Olee ụdị onye nna ha bụ? Jizọs kwuru, sị: “Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere, o guzosighịkwa ike n’eziokwu.” Jizọs kwukwara, sị: “Onye si na Chineke na-ege ntị n’okwu Chineke. Ọ bụ ya mere unu adịghị ege ntị, n’ihi na unu esiteghị na Chineke.”—Jọn 8:44, 47.

Ihe a Jizọs kwuru were ndị Juu ezigbo iwe, ha agwa ya, sị: “Ọ̀ kwa anyị kwuru ekwu na ị bụ onye Sameria nakwa na mmụọ ọjọọ ji gị?” Ha kpọrọ Jizọs “onye Sameria” iji gosi na ha kpọrọ ya asị. Jizọs leghaara mkparị a ha kparịrị ya anya ma gwa ha, sị: “Mmụọ ọjọọ ejighị m, kama m na-asọpụrụ Nna m, unu adịghịkwa asọpụrụ m.” Nkwa Jizọs kwere gosiri na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-edebe okwu m, ọ gaghị anwụ ma ọlị.” Jizọs anaghị ekwu na ndịozi ya na ndị ọzọ na-eso ụzọ ya agaghị anwụ ọnwụ nkịtị. Ihe ọ na-ekwu bụ na ha agaghị anwụ ọnwụ ebighị ebi, ya bụ, “ọnwụ nke abụọ.” Onye nwụrụ ọnwụ nke abụọ a enweghị olileanya na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.—Jọn 8:48-51; Mkpughe 21:8.

Ma, ndị Juu chere na Jizọs na-ekwu maka ọnwụ nkịtị. Ha sịrị ya: “Ugbu a ka anyị maara na i nwere mmụọ ọjọọ. Ebreham nwụrụ, ndị amụma nwụkwara; ma ị na-asị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-edebe okwu m, ọ gaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị.’ Ị̀ ka nna anyị Ebreham, bụ́ onye nwụrụnụ? . . . Ònye ka ị na-asịdị na ị bụ?”—Jọn 8:52, 53.

O doro anya na ihe Jizọs na-ekwu bụ na ya bụ Mesaya ahụ, ma ọ gwaghị ha ya hoo haa. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na m na-enye onwe m otuto, otuto m abụghị ihe ọ bụla. Ọ bụ Nna m na-enye m otuto, bụ́ onye ahụ unu na-asị na ọ bụ Chineke unu; ma unu amabeghị ya. Ma amaara m ya. Ọ bụrụkwa na mụ asị na amaghị m ya, m ga-adị ka unu, wee bụrụ onye ụgha.”—Jọn 8:54, 55.

Jizọs kwuziri banyere Ebreham nna nna ha, sị: “Ebreham nna unu ji ọṅụ dị ukwuu tụọ anya ịhụ ụbọchị m, ọ hụkwara ya wee ṅụrịa ọṅụ.” N’eziokwu, Ebreham kweere na nkwa Chineke ga-emezu ma na-atụ anya ọbịbịa Mesaya. Ndị Juu ekwetaghị n’ihe a Jizọs kwuru. N’ihi ya, ha jụrụ ya, sị: “Ị̀ na-ekwu na ị hụwo Ebreham mgbe ị na-erubeghị afọ iri ise?” Jizọs zara ha, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, tupu a mụọ Ebreham, mụ onwe m adịrịla ndụ.” Jizọs kwuru ihe a n’ihi na ọ bụbu mmụọ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa.—Jọn 8:56-58.

Ihe a Jizọs kwuru, nke bụ́ na ya adịrịla ndụ tupu Ebreham, were ndị Juu iwe, ha achọọ ịtụ ya nkume. Ma, Jizọs pụrụ n’ụlọ nsọ ahụ n’enweghị ihe mere ya.