Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Ị̀ ga-asị na ọ bụ . . .

  • ihe dị mmadụ n’obi?

  • eluigwe?

  • ọchịchị dị n’eluigwe?

GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

“Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị.”—Daniel 2:44, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

“E nyere ya ọchịchị, mee ka a na-akwanyere ya ùgwù, nyekwa ya alaeze . . . Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị akwụsị akwụsị.”—Daniel 7:14.

OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?

  • Ọchịchị a ga-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.—Aịzaya 48:17, 18.

  • Mgbe Chineke ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs, ị gaghị arịa ọrịa, obi ga na-atọkwa gị ụtọ mgbe niile.—Mkpughe 21:3, 4.

Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?

Ee. Lee ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • Jizọs kwuru ihe Alaeze Chineke ga-eme. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa nakwa ka uche Chineke mee n’ụwa. (Matiu 6:9, 10) Jizọs gosiri otú Chineke ga-esi za ekpere a.

    Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nyere ndị agụụ ji nri, gwọọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. (Matiu 15:29-38; Jọn 11:38-44) Ọ bụ Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke. Ihe ndị a o meere ndị mmadụ gosiri ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ amaala ya.—Mkpughe 11:15.

  • Ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a na-egosi na Alaeze Chineke ga-abịa n’oge na-adịghị anya. Jizọs kwuru na tupu Alaeze Chineke emee ka udo dịrị n’ụwa a, a ga-enwe ụkọ nri, ala ọma jijiji na agha n’ebe dị iche iche.—Matiu 24:3, 7.

    Ihe ndị a na-eme eme taa. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Alaeze Chineke ga-abịa n’oge na-adịghị anya ma kwụsị nsogbu anyị niile.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Olee otú ihe ga-adị ma Alaeze Chineke chịwa ụwa a?

Baịbụl zara ajụjụ a n’ABỤ ỌMA 37:29 nakwa n’AỊZAYA 65:21-23.