AJỤJỤ NKE 4
Olee Otú M Ga-esi Mezie Ihe M Mejọrọ?
GỊNỊ KA Ị GA-EME?
Chegodị banyere ihe atụ a: Tim na ndị enyi ya nọ na-egwu egwu, ya atụọ bọl, bọl ahụ agaa kụwaa enyo dị́ n’ụgbọala onye agbata obi ha.
Ọ bụrụ na ị bụ Tim, gịnị ka ị ga-eme?
CHEGODỊ ECHICHE
E NWERE IHE ATỌ I NWERE IKE IME:
-
A. Ịgba ọsọ.
-
B. Ikwu na ọ bụ onye ọzọ kụwara ya.
-
CH. Ịgwa onye ahụ ihe merenụ, gwakwa ya na ị ga-akwụ ụgwọ ya.
Obi gị nwere ike ịgwa gị ka ị họrọ Nke A. Ma e nwere ezigbo ihe mere ị ga-eji kweta ihe i mejọrọ, ma ị̀ kụwara enyo dị́ n’ụgbọala ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ.
IHE ATỌ MERE Ị GA-EJI KWETA IHE I MEJỌRỌ
-
Ọ bụ ihe i kwesịrị ime.
Baịbụl kwuru, sị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”
—Ndị Hibru 13:18. -
Mmadụ kweta ihe o mejọrọ, o nwere ike ime ka a gbaghara ya.
Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.”
—Ilu 28:13. -
Nke ka nke, ọ na-eme Chineke obi ụtọ.
Baịbụl kwuru, sị: “Onye aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova, ma ya na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.”
—Ilu 3:32.
N’Amerịka, otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri abụọ aha ya bụ Karina bu ụgbọala gbaa ọnwụ ọnwụ, ndị gọọmenti erie ya iwu, ya ezochiere ya papa ya. Ma, o zochilighị ya ruo mgbe ebighị ebi. Karina kwuru, sị: “Mgbe ihe dị́ ka otu afọ gara, papa m hụrụ akwụkwọ e ji rie m iwu e dere aha m na ya. Abara m n’ezigbo nsogbu.”
Gịnị ka ihe a na-akụziri gị? Karina sịrị: “Izochi ihe i mejọrọ ga-eme ka ihe ka njọ. Ị ga-emecha taa ahụhụ ya.”
OTÚ Ị GA-ESI MỤTA IHE N’IHE NDỊ I MEJỌRỌ
Baịbụl kwuru, sị: “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ikweta ihe i mejọrọ ga-egosi na ị dị umeala n’obi nakwa na ị ghọọla dimkpa, nke ka nke, ma i kweta ozugbo.
Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịmụta ihe n’ihe ndị i mejọrọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Vera sịrị: “M na-agba mbọ ịmụta ihe n’ihe ọ bụla m mejọrọ. Ọ na-enyere m aka ịghọkwu ezigbo mmadụ. M na-amata ihe m kwesịrị ime mgbe ọzọ.” Ka anyị chọpụta otú ị ga-esi eme ya.
Ka e were ya na papa gị bunyere gị ọgba tum tum ya, gị emebie ya. Gịnị ka ị ga-eme?
-
Gbachi nkịtị ma kpewe ekpere ka papa gị ghara ịmata.
-
Gwa papa gị ihe merenụ.
-
Gwa papa gị ihe merenụ ma kwuo na ọ bụ onye ọzọ kpatara ya.
Ka e were ya na ị dara ule n’ihi na ị gụghị akwụkwọ. Gịnị ka ị ga-eme?
-
Ikwu na ule ahụ siri ike.
-
Ikweta na ọ bụ gị mere onwe gị.
-
Ikwu na onye nkụzi kpọrọ gị asị.
Chegodị banyere ihe atụ ndị ahụ anyị nyeburu. Were ya na ị bụ (1) papa gị na (2) onye nkụzi unu. Olee otú papa gị na onye nkụzi unu ga-esi ele gị anya ma i kweta ihe i mejọrọ ozugbo? Olee otú ha ga-esi ele gị anya ma i zochie ihe i mejọrọ?
Chebara ihe ndị i mejọrọ n’afọ gara aga echiche ma zaa ajụjụ ndị a.
Gịnị bụ ihe ahụ i mejọrọ? Olee ihe i mere banyere ya?
-
M zochiri ya.
-
M kwuru na ọ bụ onye ọzọ kpatara ya.
-
M kwetara ozugbo na ọ bụ m mere ya.
Ọ bụrụ na i kwetaghị ihe i mejọrọ, olee otú obi mechara dị́ gị?
-
Obi dị m ụtọ maka na o nweghị onye matara ihe m mere.
-
Obi nọ na-apịa m ụtarị. M gaara ekwu eziokwu.
Olee ihe ka mma ị gaara eme?
Gịnị ka ị mụtara n’ihe ahụ i mejọrọ?
GỊNỊ KA I CHERE?
Gịnị mere ụfọdụ ndị anaghị ekweta ihe ha mejọrọ?
Olee otú ndị mmadụ ga-esi na-ele gị anya ma ị na-ezochikarị ihe i mejọrọ? Ma, olee otú ha ga-esi na-ele gị anya ma ị na-ekweta ihe i mejọrọ?