Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 5

Gịnị Ka M Ga-eme ma A Chọwa M Okwu n’Ụlọ Akwụkwọ?

Gịnị Ka M Ga-eme ma A Chọwa M Okwu n’Ụlọ Akwụkwọ?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Ihe i mere nwere ike ime ka ihe ka mma ma ọ bụ ka njọ.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: Thomas achọghị ịga ụlọ akwụkwọ taa, echi, ma ọ bụ ụbọchị ọzọ. Nsogbu ya malitere ọnwa atọ gara aga mgbe ụmụ akwụkwọ ibe ya ji ya na-agba asịrị. Ha gụrụ ya ọtụtụ aha. Mgbe ụfọdụ, otu onye na-akụpụ akwụkwọ ndị o ji n’aka ma mee ka ọ maghị ụma mee ya. Ọ bụrụ na ha dị ọtụtụ, otu onye na-esi n’azụ kwaa ya aka, ma ọ tụgharịa, ọ gaghị ama onye n’ime ha mere ya. Ụnyaahụ, ha si n’Ịntanet zitere ya ozi na ha ga-emesi ya ike . . .

Ọ bụrụ na ị bụ Thomas, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

Ọ pụtaghị na e nweghị ihe ị ga-emeli. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị ga-emerili onye na-achọ gị okwu n’emetụghị ya aka. Olee otú ị ga-esi eme ya?

  • JIDE ONWE GỊ. Baịbụl sịrị: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.” (Ilu 29:11) Ọ bụrụ na i jide onwe gị ma gbachi nkịtị, ike nwere ike ịgwụ ndị na-achọ gị okwu.

  • EMEGWARALA. Baịbụl sịrị: “Ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:17) Imegwara ga-eme ka ihe ka njọ.

  • GBAARA NSOGBU ỌSỌ. Baịbụl sịrị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Gbasie mbọ ike ka ị gbaara ndị nwere ike ịchọ gị okwu ọsọ. Emekwala ihe ga-eme ka a chọọ gị okwu.

  • MEE IHE Ọ NA-ATỤGHỊ ANYA YA. Baịbụl sịrị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa.” (Ilu 15:1) I nwedịrị ike ikwu ihe na-atọ ọchị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye na-achọ gị okwu akpọọ gị akpa akpụ, i nwere ike ịchịtụ ọchị, sị ya, “Ọ dị ka ị̀ ma na m kwesịrị ifelatatụ.”

  • GBACHI YA NKỊTỊ. Otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri na itoolu aha ya bụ Nora sịrị: “Ịgba nkịtị ga-egosi na ị bụ dimkpa nakwa na ị ka onye ahụ ike. Ọ ga-egosikwa na ị na-ejide onwe gị. Ọ bụ ihe onye na-achọ gị okwu na-agaghị emeli.”2 Timoti 2:24.

  • GBALỊA KA Ị GHARA ỊNA-ATỤ ỤJỌ. Ndị ọchọ okwu na-amakarị ndị obi na-akaghị, ndị na-agaghị emegwara ma a chọọ ha okwu. Ma ike ga-agwụ ọtụtụ ndị ọchọ okwu ma ha hụ na i kweghị ka ha menye gị ụjọ.

  • GWA YA ONYE ỌZỌ. Otu onye bụ́bu onye nkụzi sịrị: “Ihe m na-agwa onye a na-achọ okwu bụ ka ọ gwa ya onye ọzọ. Ọ bụ ihe onye ahụ kwesịrị ime. O nwere ike ime ka ọchọ okwu ahụ ghara ịchọ onye ọzọ okwu.”

Ịkata obi ga-eme ka i nwee ụdị ike onye na-achọ gị okwu na-enweghị