Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 10

Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere M Aka?

Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere M Aka?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Baịbụl sịrị na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, Baịbụl ga-agwa gị ihe i kwesịrị ime.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: David ji ụgbọala na-aga ebe ọ na-agatụbeghị. Ka ọ na-aga, saịn bọọdụ na ihe ndị ọzọ ọ na-ahụ gosiri na ọ ghọtaghịzi ebe ọ nọ. Mgbe ahụ ka ọ matara na ya efuola ụzọ. Ọ ga-abụrịrị na o sila ụzọ ọ na-ekwesịghị isi.

Ọ bụrụ na ị bụ David, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

E nwere ọtụtụ ihe i nwere ike ime:

  1. A. Ịjụ mmadụ ajụjụ.

  2. B. Ile anya na map.

  3. CH. Ịnyara ụgbọala gị na-aga, buru n’obi na ị ga-emecha chọta ụzọ.

O doro anya na ọ bụ nke CH kacha njọ.

Nke B ka nke mbụ mma n’ihi na ọ pụtara na ị gbatụ, gị elee anya na map ahụ ka ị ghara ifu ụzọ.

Baịbụl ga-enyere gị aka otú ahụ.

Ọ bụ akwụkwọ ndị mmadụ kacha azụ n’ụwa.

  • Ọ ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị i nwere

  • Ọ ga-eme ka ị mata ụdị onye ị bụ ma bụrụ ezigbo mmadụ

  • Ọ ga-egosi gị otú ị ga-esi bie ndụ kacha mma

OTÚ ANYỊ GA-ESI MATA AZỊZA AJỤJỤ NDỊ NA-ECHU ANYỊ ỤRA

Anyị na-amalite mgbe anyị bidoro ikwu okwu jụwa ajụjụ.

  • Oleedị otú e si kee eluigwe?

  • Gịnị mere kpakpando ji dịchaa ntakịrị ntakịrị?

Anyị na-emecha jụwa ajụjụ gbasara ihe ndị na-eme n’ụwa.

Ị̀ ma na azịza ajụjụ ndị a dị na Baịbụl kemgbe?

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ihe juru na Baịbụl bụ akụkọ ifo na akụkọ ndị mgbe ochie, na oge ya agafeela, nakwa na ọ naghị ekwe nghọta. Ma, ihe bụ́ nsogbu ọ̀ bụ ihe Baịbụl kwuru, ka ọ̀ bụ ihe ndị mmadụ nụrụ banyere Baịbụl? Ọ̀ ga-abụ na ihe a gwara ha abụghị eziokwu?

Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ chere na Baịbụl kwuru na ọ bụ Chineke na-achị ụwa. Ma, olee otú ọ ga-esi bụrụ eziokwu ebe ihe juru n’ụwa a bụ ọgba aghara, obi mgbawa, ahụhụ, ọrịa na ọnwụ, ịda ogbenye na ọdachi? Chineke hụrụ anyị n’anya. Oleezi otú ihe ọjọọ a niile ga-esi na-eme ma ọ bụrụ ya na-achị ụwa?

Ị̀ chọrọ ịmata azịza ajụjụ ndị a? Onye Baịbụl kwuru na-achị ụwa a nwere ike iju gị anya.

Ọ ga-abụ na ị chọpụtala na ndụmọdụ ndị dị na broshọ a si na Baịbụl. Ndịàmà Jehova kwetasiri ike na ọ bụ Baịbụl ga-akụziri ndị mmadụ ihe ha kwesịrị ime. Ọ bụ n’ihi na Baịbụl ‘si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, na iji ya mee ka ihe guzozie.’ (2 Timoti 3:16, 17) I kwesịrị ịgụ akwụkwọ a e dere n’oge ochie, nke bakwara uru taa.