Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 1

Chineke Ekee Eluigwe na Ụwa

Chineke Ekee Eluigwe na Ụwa

Jehova Chineke kere anyị. Ọ bụ ya kere ihe niile, ma ihe ndị anyị na-ahụ anya ma ihe ndị anyị na-anaghị ahụ anya. Tupu ya ekee ihe ndị anyị na-ahụ anya, o kere ọtụtụ ndị mmụọ ozi. Ị̀ ma otú ndị mmụọ ozi dị? Jehova kere ha ka ha dị ka ya. Anyị enweghị ike ịhụ ha anya, otú ahụ anyị na-enweghị ike ịhụ Chineke anya. Mmụọ ozi mbụ Jehova kere nyeere ya aka ike ihe. O nyeere Jehova aka kee kpakpando, keekwa ihe ndị Bekee na-akpọ planet, nakwa ihe ndị ọzọ. Otu n’ime planet a bụ ụwa anyị a mara mma.

Jehova bịaziri kee ihe ndị ọzọ n’ụwa ka ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nwee ike ibi na ya. O mere ka ìhè anyanwụ na-achabata n’ụwa. O kekwara ugwu na osimiri dị iche iche.

Olee ihe ndị ọzọ Jehova kere? Jehova kwuru, sị: ‘M ga-eme ahịhịa, ahịhịa ndụ ndị na-amị mkpụrụ, na osisi ndị na-amị mkpụrụ.’ Ọtụtụ osisi na-amị mkpụrụ na akwụkwọ nri dị iche iche, nakwa okooko osisi dị iche iche malitere ipulite. Jehova bịara kee ụmụ anụmanụ, ma ndị na-efe efe, ma ndị na-egwu mmiri, ma ndị na-arị arị ma ndị na-akpụ akpụ. O kekwara ụmụ anụmanụ ndị obere, dị ka ewi, keekwa ndị nnukwu, dị ka enyí. Olee anụmanụ kacha amasị gị?

Jehova gwaziri mmụọ ozi mbụ ahụ o kere, sị: “Ka anyị mee mmadụ.” Ụmụ mmadụ ga-adị iche ná anụmanụ. Ụmụ mmadụ nwere ike imepụta ihe. Ha nwere ike ikwu okwu, ịchị ọchị, na ikpe ekpere. Ha ga na-elekọta ụwa na ụmụ anụmanụ. Ị̀ ma nwoke mbụ Chineke kere? Anyị ga-amata onye ọ bụ n’isiokwu nke abụọ.

“Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.”​—Jenesis 1:1