Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 2

Chineke Ekee Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

Chineke Ekee Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

Jehova kụrụ ubi n’ebe a na-akpọ Iden. E nwere ọtụtụ okooko osisi na osisi, nweekwa ọtụtụ ụmụ anụmanụ na ya. Mgbe Chineke kechara ihe ndị a, o ji ájá kee nwoke mbụ bụ́ Adam ma kunye ume ndụ n’oghere imi ya abụọ. Ị̀ ma ihe merenụ mgbe o kunyechara ya ume a? Nwoke ahụ ghọrọ mmadụ. Jehova gwara Adam ka ọ na-elekọta ubi ahụ. Ọ gwakwara ya ka ọ gụọ ụmụ anụmanụ niile aha.

Jehova nyere Adam iwu dị mkpa. Ọ gwara ya, sị: ‘I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a, e wezụga otu nke pụrụ iche. I rie mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụ.’

Jehova mechara kwuo, sị: ‘M ga-emere Adam onye inyeaka.’ O mere ka Adam hie oké ụra. Ka Adam na-ehi ụra, Chineke wepụtara otu n’ime ọgịrịga ya ma were ya kee nwunye ya. Aha ya bụ Iv. Adam na Iv ghọrọ ezinụlọ mbụ. Olee otú obi dị Adam mgbe ọ hụrụ nwunye ya? Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya ekwuo, sị: ‘Lee onye Jehova si n’ọgịrịga m kee. N’ikpeazụ, enweela onye dị ka m.’

Jehova gwara Adam na Iv ka ha mụọ ụmụ ma jupụta ụwa. Ọ chọrọ ka ha na-arụkọ ọrụ ma mee ka ụwa niile bụrụ paradaịs ma ọ bụ ogige mara mma otú ahụ ogige Iden dị. Ma, ụwa abụghị paradaịs ugbu a otú ahụ Jehova chọrọ. Gịnị mere na ọ bụghị paradaịs? Isiokwu nke atọ ga-akọrọ anyị ihe kpatara ya.

“Onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị.”​—Matiu 19:4