Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 3

Adam na Iv Enupụrụ Chineke Isi

Adam na Iv Enupụrụ Chineke Isi

Otu ụbọchị, mgbe Iv nọ naanị ya, otu agwọ gwara ya okwu. Ọ sịrị ya: ‘Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ osisi niile dị n’ubi a?’ Iv gwara ya, sị: ‘Anyị nwere ike iri mkpụrụ osisi si n’osisi niile e wezụga otu. Ọ bụrụ na anyị erie nke ahụ, anyị ga-anwụ.’ Agwọ ahụ gwara ya, sị: ‘Unu agaghị anwụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na unu rie ya, unu ga-adị ka Chineke.’ Ihe a agwọ a gwara Iv, ọ̀ bụ eziokwu? Mba, ọ bụ ụgha. Ma, Iv kwetara ihe a ọ gwara ya. Ka Iv na-ele mkpụrụ osisi ahụ anya, ka ọ na-adọ ya akpịrị. Iv riri mkpụrụ osisi ahụ, mechaa, nye di ya ka o rie. Adam ma na ọ bụrụ na ha enupụrụ Chineke isi na ha ga-anwụ. Ma Adam mechara rie ya.

Jehova mechara gwa Adam na Iv okwu n’ụbọchị ahụ. Ọ jụrụ ha ihe mere ha ji nupụrụ ya isi. Iv sịrị na ọ bụ agwọ ahụ mere o ji rie mkpụrụ osisi ahụ. Adam asịkwanụ na ọ bụ Iv nyere ya. Jehova chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden n’ihi na ha nupụụrụ ya isi. Jehova dowere ndị mmụọ ozi na mma agha ihu ya na-egbukepụ ọkụ, nke na-agbakwa gburugburu, n’ụzọ e si abanye n’ogige ahụ ka Adam na Iv ghara ịbanye na ya ọzọ.

Ma, ọ bụghị agwọ nkịtị gwara Iv okwu. Jehova ekeghị agwọ ka ha na-ekwu okwu. Ọ bụ mmụọ ozi ọjọọ mere ka agwọ ahụ kwuo okwu. A na-akpọ ya Setan bụ́ Ekwensu. O mere ihe a ka ọ ghọgbuo Iv. Jehova kwuru na ọ ga-ata onye ahụ ghaara Iv ụgha ahụhụ. N’ọdịnihu, Jehova ga-ebibi Setan ka ọ ghara ịna-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ.

“Ekwensu . . . bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere, o guzosighịkwa ike n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya.”​—⁠Jọn 8:44