Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 4

O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe

O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe

Adam na Iv mụrụ ọtụtụ ụmụ mgbe ha si n’ogige Iden pụta. Nwa mbụ ha aha ya bụ Ken bụ onye ọrụ ugbo. Nwa ha nke abụọ aha ya bụ Ebel na-azụ atụrụ.

Otu ụbọchị, Ken na Ebel chụụrụ Jehova àjà. Ị̀ ma ihe àjà bụ? Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye Jehova. Jehova nabatara àjà Ebel, ma ọ nabataghị nke Ken. Nke a mere ka Ken wee ezigbo iwe. Jehova gwara Ken na iwe ọ na-ewe nwere ike ime ka o mee ihe ọjọọ. Ma, Ken egeghị Jehova ntị.

E mechaa, Ken gwara Ebel, sị: ‘Ka anyị gaa n’ọhịa.’ Mgbe ha nọ n’ọhịa, Ken kụgburu ya. Gịnị ka Jehova mere Ken? Ọ tara Ken ahụhụ. Otú o si mee ya bụ na ọ chụpụrụ ya n’ụlọ ha, chụga ya ebe dị anya. A gaghị ekwe ka Ken laghachi n’ụlọ ha ọzọ.

Gịnị ka anyị ga-amụta n’akụkọ a? Anyị nwere ike ịna-ewe iwe ma ọ bụrụ na ihe anaghị aga otú anyị si chọọ. Ọ bụrụ na anyị ana-ewe iwe, ma ọ bụ na ndị ọzọ achọpụta na anyị na-ewe iwe ma gwa anyị kwụsị ya, anyị kwesịrị ịkwụsị ya ozugbo tupu iwe ahụ emee ka anyị mee ihe ọjọọ.

Jehova na-echeta Ebel n’ihi na o mere ihe dị mma, hụkwa Jehova n’anya. Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ mgbe ọ ga-eme ka ụwa a bụrụ paradaịs.

“Buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.”​—⁠Matiu 5:24