Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 5

Ụgbọ Noa

Ụgbọ Noa

Ka oge na-aga, a bịara nwee ọtụtụ mmadụ n’ụwa. Ọtụtụ n’ime ha na-eme ihe ọjọọ. Ụfọdụ ndị mmụọ ozi bi n’eluigwe bidokwara ime ihe ọjọọ. Ha hapụrụ eluigwe bịa biri n’ụwa. Ị̀ ma ihe mere ha ji bịa biri n’ụwa? Ọ bụ ka ha nwee ike ịghọ mmadụ ma lụrụ ụmụ nwaanyị.

Ndị mmụọ ozi ndị ahụ na ụmụ nwaanyị ha mụtara ụmụ. Ụmụ ha bịara sie ezigbo ike, na-etigbu ndị mmadụ. Ha na-emesi ndị mmadụ ike. Jehova ekweghị ka ha mere ihe ọjọọ ndị ahụ na-aga. N’ihi ya, o kwuru na ya ga-eji mmiri bibie ndị na-eme ihe ọjọọ.

Ma, o nwere otu nwoke dị iche. Ọ hụrụ Jehova n’anya. Aha ya bụ Noa. O nwere nwaanyị na ụmụ atọ. Aha ụmụ ya bụ Shem, Ham, na Jefet. Ụmụ ya atọ a lụkwara nwaanyị. Jehova gwara Noa ka ọ rụọ nnukwu ụgbọ. Ụgbọ a bụ nnukwu igbe nwere ike ise n’elu mmiri, nke ya na ezinụlọ ya ga-anọ n’ime ya ka mmiri ahụ ghara igbu ha. Jehova gwakwara Noa ka o webata ọtụtụ ụmụ anụmanụ n’ime ụgbọ ahụ ka ha gharakwa ịnwụ.

Noa malitere ịrụ ụgbọ ahụ ozugbo. O were Noa na ezinụlọ ya ihe dị ka afọ iri ise ịrụcha ya. Ha rụrụ ya otú ahụ Jehova gwara ha rụọ ya. N’oge Noa na-arụ ụgbọ ahụ, ọ nọ na-agwa ndị mmadụ na Jehova ga-eji mmiri bibie ụwa. Ma ha egeghị ya ntị.

Olee ihe Noa na ezinụlọ ya mechara mee mgbe ha rụchara ụgbọ ahụ? Anyị ga-amata n’isiokwu nke isii.

“Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.”​—⁠Matiu 24:37