Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 6

Chineke Echebe Mmadụ Asatọ n’Oge Ochie

Chineke Echebe Mmadụ Asatọ n’Oge Ochie

Noa na ezinụlọ ya na ụmụ anụmanụ banyere n’ụgbọ ahụ. Mgbe ha banyechara, Jehova mechiri ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ, mmiri amalite izo. Mmiri ahụ zogidere nke na ụgbọ ahụ malitere ise n’elu ya. Mmiri ahụ mechara tojuo ebe niile n’ụwa. Ndị niile na-eme ihe ọjọọ nwụrụ n’ihi na ha anọghị n’ụgbọ ahụ. Ma e nweghị ihe mere Noa na ezinụlọ ya. Obi tọgburu ha atọgbu maka na ha rubeere Jehova isi.

Mmiri ahụ zoro abalị iri anọ, ehihie na abalị, ma kwụsị. Ọ malitere iji nwayọọ nwayọọ na-ata. N’ikpeazụ, mmiri ahụ busara ụgbọ ahụ n’elu ugwu. Noa na ezinụlọ ya esighị n’ụgbọ ahụ pụta ozugbo n’ihi na mmiri ahụ atachabeghị.

Mmiri ahụ ji nwayọọ nwayọọ tachaa. Noa na ezinụlọ ya nọrọ n’ụgbọ ahụ ihe karịrị otu afọ. Jehova gwaziri ha ka ha si n’ụgbọ ahụ pụta ma biri n’ụwa a na-enweghịzi ndị ọjọọ na ya. Ha kelere Jehova nke ukwuu maka na ọ zọpụtara ha. Otú ha si kelee ya bụ na ha chụụrụ ya àjà.

Obi tọrọ Jehova ụtọ maka àjà a ha chụụrụ ya. O kwere ha nkwa na ya agaghị eji mmiri bibie ihe niile dị n’ụwa ọzọ. Jehova mere ka eke na egwurugwu mbụ pụta na mbara ígwé iji gosi na ya ga-emezu nkwa a. Ị̀ hụtụla eke na egwurugwu?

Jehova gwakwara Noa na ndị ezinụlọ ya ka ha mụọ ụmụ ma jupụta ụwa.

‘Noa banyere n’ụgbọ ahụ, ndị mmadụ amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara kpochapụ ha niile.’​—⁠Matiu 24:38, 39