Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 7

Ụlọ Elu Bebel

Ụlọ Elu Bebel

Mgbe Iju Mmiri ahụ gachara, ụmụ Noa na ndị nwunye ha mụrụ ọtụtụ ụmụ. Ụmụ ha toro, mụtakwa ụmụ nke ha. Ha gbasara ebe niile n’ụwa otú ahụ Jehova gwara ha mee.

Ma, ụfọdụ n’ime ụmụ ha emeghị ihe ahụ Jehova gwara ha. Ha gwara ibe ha, sị: ‘Ka anyị wuonụ obodo biri na ya. Anyị ga-ewu ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe. Aha anyị ga na-ewukwa ewu.’

Obi adịghị Jehova mma maka ụlọ a ha na-ewu. N’ihi ya, ọ kwụsịrị ha iwu ya. Ị̀ ma otú o si mee ya? O mere ka ha malite ịsụ asụsụ dị iche iche na mberede kama ịsụ otu asụsụ. Ha kwụsịrị iwu ụlọ ahụ, ebe ọ bụ na ha anaghịzi aghọta ihe ibe ha na-ekwu. A kpọrọ obodo ahụ Bebel, nke pụtara “Aghara.” Ndị mmadụ si ebe ahụ pụọ gaa biri n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ma, ha akwụsịghị ihe ọjọọ ndị ha na-eme n’ebe ndị ahụ ha gara biri. Ma, è nwere onye n’ime ha ka hụrụ Jehova n’anya? Anyị ga-achọpụta n’isiokwu nke asatọ.

“Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, ma onye na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”​—Luk 18:14