Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 8

Ebreham na Sera Erubere Chineke Isi

Ebreham na Sera Erubere Chineke Isi

E nwere otu obodo a na-akpọ Ọọ. Obodo a dị nso na Bebel. Ndị bi na Ọọ anaghị efe Jehova, kama ha nwere ọtụtụ chi ha na-efe. Ma, e nwere otu nwoke bi na Ọọ nke na-efe Jehova. Aha ya bụ Ebreham.

Otu ụbọchị, Jehova gwara Ebreham, sị: ‘Si n’obodo gị, n’etiti ndị ikwu gị, kwapụ gaa n’obodo m ga-egosi gị.’ Chineke kwekwara ya nkwa, sị: ‘M ga-emekwa ka ị ghọọ mba ukwu, m ga-emere ọtụtụ mmadụ n’ụwa niile ihe ọma n’ihi gị.’

Ebreham amaghị ebe Jehova sịrị ya gaa, ma ọ tụkwasịrị ya obi. Ka ha nwee ike ime ihe ahụ Jehova kwuru, Ebreham na nwunye ya Sera, nna ya Tira, na nwa nwanne ya Lọt buuru ihe ha malite ogologo njem.

Ebreham dị afọ iri asaa na ise mgbe ya na ndị ezinụlọ ya kwatara n’obodo ahụ Jehova chọrọ ka ha gaa. Aha obodo ahụ bụ Kenan. Ọ bụ n’obodo a ka Chineke kwere Ebreham nkwa a, sị: ‘M ga-enye ụmụ gị ala a niile ị na-ahụ.’ Ma, Ebreham na Sera emeela agadi, ha enweghịkwa nwa ọ bụla. N’ihi ya, oleekwanụ otú Jehova ga-esi mezuo nkwa a?

‘Ebreham ji okwukwe rube isi wee jee n’ebe a kara aka na ọ ga-enweta dị ka ihe nketa; o wee pụọ, ọ bụ ezie na ọ maghị ebe ọ na-eje.’​—Ndị Hibru 11:8