Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 10

Cheta Nwunye Lọt

Cheta Nwunye Lọt

Lọt na nwanne nna ya aha ya bụ́ Ebreham biri na Kenan. Ha mechara nwee ọtụtụ atụrụ na ehi nke na ebe ahụ abachaghị ha. Ebreham gwara Lọt, sị: ‘Mụ na gị agaghịzi ebi otu ebe. Biko, họrọ ebe ị ga-ebi, ị gaa n’aka ekpe, m ga-aga n’aka nri.’ Ihe a Ebreham kwuru gosiri na ọ naghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru. Ọ̀ bụghị eziokwu?

Lọt hụrụ ebe mara mma n’ala ahụ. Ọ dị nso n’ebe a na-akpọ Sọdọm. Mmiri na ahịhịa ndụ juru n’ebe ahụ. N’ihi ya, ọ họọrọ ebe ahụ ma kpọrọ ezinụlọ ya gaa biri na ya. Ha mechakwara gaa biri na Sọdọm.

Ndị Sọdọm na ndị Gọmọra bụ ndị ọjọọ. Ha na-eme ihe jọgburu onwe ya nke na Jehova kwuru na ya ga-ebibi obodo ha. Ma, Chineke achọghị ibibi Lọt na ndị ezinụlọ ya. N’ihi ya, o zipụrụ ndị mmụọ ozi abụọ ka ha gaa gwa ha okwu. Ha gwara Lọt, sị: ‘Meenụ ọsọ ọsọ. Sinụ n’obodo a gbapụ. Jehova na-aga ibibi ya.’

Lọt ahapụghị Sọdọm ozugbo. Ọ nọ na-egbu oge. N’ihi ya, ndị mmụọ ozi ahụ jidere ya na nwunye ya na ụmụ ya nwaanyị abụọ n’aka ma kpọpụ ha n’obodo ahụ. Ndị mmụọ ozi ahụ gwara ha, sị: ‘Gbapụnụ n’ihi ndụ unu. Unu elela anya n’azụ. Unu lee anya n’azụ, unu ga-anwụ.’

Mgbe ha rutere n’obodo a na-akpọ Zoa, Jehova mere ka sọlfọ na ọkụ si n’eluigwe zokwasị Sọdọm na Gọmọra. Jehova bibiri obodo abụọ a kpamkpam. Mgbe nwunye Lọt nupụụrụ Jehova isi ma lee anya n’azụ, ọ ghọrọ ogidi nnu. Ma o nweghị ihe mere Lọt na ụmụ ya nwaanyị abụọ maka na ha rubeere Jehova isi. Ọ ga-abụ na obi jọrọ ha ezigbo njọ na nwunye Lọt nupụụrụ Jehova isi. Ma obi tọkwara Lọt na ụmụ ya nwaanyị abụọ ụtọ na ha rubeere Jehova isi.

“Chetanụ nwunye Lọt.”​—Luk 17:32