Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 11

Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule

Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule

Ebreham kụziiri nwa ya Aịzik ka ọ hụ Jehova n’anya, nakwa ka ọ tụkwasị Jehova obi na ọ ga-emezu ihe ndị o kwuru. Ma, mgbe Aịzik dị ihe dị ka afọ iri abụọ na ise, Jehova gwara Ebreham ka o mee ihe ga-esiri mmadụ ike ime. Gịnị bụ ihe ahụ?

Chineke gwara Ebreham, sị: ‘Biko, were nwa gị nwoke, nwa ị mụrụ naanị ya, chụọrọ m àjà n’ugwu dị n’ala Moraya.’ Ebreham amaghị ihe mere Jehova ji gwa ya mee otú ahụ. Ma, o mere ihe Jehova gwara ya mee.

N’isi ụtụtụ echi ya, Ebreham kpọọrọ Aịzik na ndị na-ejere ya ozi gawa Moraya. Mgbe ha gara ije abalị atọ, ha nọ n’ebe dị anya lelie anya hụ ugwu ahụ. Ebreham gwara ndị na-ejere ya ozi ka ha chere ka ya na Aịzik gaa chụọrọ Jehova àjà. Ebreham weere mma ma buru nkụ bo Aịzik. Mgbe ha na-aga, Aịzik jụrụ nna ya, sị: ‘Oleekwanụ atụrụ a ga-eji chụọ àjà?’ Ebreham gwara ya, sị: ‘Nwa m, Chineke ga-eweta ya.’

Mgbe ha ruru n’ugwu ahụ, ha rụrụ ebe ha ga-achụrụ Chineke àjà. Ebreham kere Aịzik agbụ ụkwụ na aka ma gbatịa ya n’elu ebe ịchụàjà ahụ.

Ebreham weere mma, welie aka ka o gbuo nwa ya. Ozugbo ọ chọrọ igbu ya, mmụọ ozi Jehova si n’eluigwe kpọọ ya òkù, sị: ‘Ebreham, emela nwa okorobịa ahụ ihe ọ bụla, ugbu a ka m matara na i nwere okwukwe na Chineke n’ihi na ị jụghị iji nwa gị chụọ àjà.’ Ebreham lere anya n’ihu ya hụ ebule nke mpi ya konyere n’osisi. O mere ngwa ngwa ketuo Aịzik agbụ ahụ o kere ya ma werezie ebule ahụ chụọrọ Chineke àjà.

Jehova kpọrọ Ebreham enyi ya si n’ụbọchị ahụ gawa. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na Ebreham mere ihe niile Jehova gwara ya mee, ma mgbe ọ na-aghọtaghị ihe mere Jehova ji gwa ya mee ha.

Jehova kwughachiri nkwa ahụ o kwere Ebreham, sị: ‘M ga-agọzi gị, m ga-emekwa ka ụmụ gị ma ọ bụ mkpụrụ gị mụbaa.’ Nke a pụtara na Jehova ga-esi n’ezinụlọ Ebreham gọzie ndị niile na-eme ihe ọ na-achọ.

“Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”​—Jọn 3:16