Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 12

Jekọb Eketa Ihe A Na-ekenye Ọkpara

Jekọb Eketa Ihe A Na-ekenye Ọkpara

Aịzik dị afọ iri anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka. Ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Ha mechara mụta ụmụ nwoke abụọ bụ́ ejima.

Aha nke mbụ bụ Isọ. Aha nke abụọ abụrụ Jekọb. Isọ na-agakarị n’ọhịa. Ọ makwa otú e si achụ nta. Ma, Jekọb na-anọkarị n’ụlọ.

N’oge ahụ, a na-ekenye ọkpara ala na ego buru ibu ma nna ya nwụọ karịa ụmụnne ya. A na-akpọ ya ihe a na-ekenye ọkpara. Ma, a bịa n’ezinụlọ Aịzik, nkwa ndị ahụ Jehova kwere Ebreham so n’ihe ọkpara Aịzik kwesịrị inweta. Isọ ejighị ha kpọrọ ihe, ma Jekọb ji ha kpọrọ ihe.

Otu ụbọchị, Isọ si ịchụ nta lọta, ezigbo ike gwụkwara ya. Ọ nụrụ ísì ọmarịcha nri Jekọb nọ na-esi. Ọ sịrị ya: ‘Agụụ agụgbuola m. Kunyetụ m ofe ahụ na-acha ọbara ọbara.’ Jekọb sịrị ya: ‘M ga-ekunye gị, ma buru ụzọ resị m ihe ruuru gị ka ọkpara.’ Isọ zara ya, sị: ‘Olee uru ọ baara m? Werenụ ya, achọrọ m iri nri.’ Ì chere na ihe a Isọ mere bụ ihe o kwesịrị ime? Mba. Isọ tụfuru ihe dị ezigbo mkpa n’ihi otu efere ofe.

Mgbe Aịzik merela ezigbo agadi, ọ gwara ọkpara ya ka ọ bịa ka ya gọzie ya. Ma, Ribeka nyeere Jekọb, bụ́ nwa ya nke obere aka, Aịzik agọzie ya. Mgbe Isọ matara ihe na-emenụ, ezigbo iwe were ya. Ọ chọwara otú ọ ga-esi egbu nwanne ya. Aịzik na Ribeka achọghị ka Isọ gbuo Jekọb. Ọ bụ ya mere ha ji gwa Jekọb sị: ‘Gakwuru nwanne nne gị Leban ka gị na ya biri ruo mgbe iwe nwanne gị dajụrụ.’ Jekọb mere ihe a nne na nna ya gwara ya.

“Olee uru ọ baara mmadụ irite ụwa dum n’uru ma tụfuo mkpụrụ obi ya? N’ezie, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere mkpụrụ obi ya?”​—Mak 8:36, 37