Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 13

Jekọb na Isọ Ekpezie

Jekọb na Isọ Ekpezie

Jehova kwere Jekọb nkwa na ya ga-echebe ya otú ahụ o chebere Ebreham na Aịzik. Jekọb gara biri n’ebe a na-akpọ Heran. Ọ nọ ebe ahụ lụọ nwaanyị, mụta ọtụtụ ụmụ ma nwee ọtụtụ ihe.

Ka oge na-aga, Jehova gwara Jekọb, sị: ‘Laghachi n’ala nna gị hà.’ N’ihi ya, Jekọb na ezinụlọ ya malitere ogologo njem ka ọ laghachi n’ala nna ya hà. Ka ha na-aga, ụfọdụ bịara gwa Jekọb, sị: ‘Nwanne gị Isọ na-abịa, ya na narị ndị ikom anọ.’ Ụjọ tụrụ Jekọb na Isọ chọrọ igbu ya na ezinụlọ ya. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jehova , sị: ‘Biko, napụta m n’aka nwanne m nwoke.’ N’echi ya, Jekọb zigaara Isọ onyinye. O nyere ya ọtụtụ atụrụ, ewu, ehi, kamel, na ịnyịnya ibu.

Mgbe Jekọb nọ naanị ya n’abalị ụbọchị ahụ, ọ hụrụ otu mmụọ ozi. Ya na Jekọb malitere ịgba mgba. Ha gbagidere mgba chi abọọ. Ọ bụ eziokwu na mmụọ ozi ahụ merụrụ Jekọb ahụ́, ma Jekọb ahapụghị ya. Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: ‘Hapụ m ka m laa.’ Ma Jekọb sịrị ya: ‘Agaghị m ahapụ gị, ruo mgbe ị gọziri m.’

Mmụọ ozi ahụ mechara gọzie Jekọb. Ihe a mere ka Jekọb mata na Jehova agaghị ekwe ka Isọ gbuo ya.

N’ụtụtụ ụbọchị ahụ, Jekọb nọ n’ebe dị anya hụ Isọ na narị ndị ikom anọ ka ha na-abịa. Jekọb gafere ndị ezinụlọ ya ma kpọọrọ nwanne ya isiala ugboro asaa ruo mgbe o rutere ya nso. Isọ gbaara ọsọ gaa zute Jekọb ma makụọ ya. Ha abụọ malitere ibe ákwá ma kpezie. Olee otú i chere obi dị Jehova maka otú Jekọb si mee ka ya na nwanne ya kpezie?

Isọ mechara laghachi n’ụlọ ya, Jekọb alawakwanụ n’ụlọ nke yanwa. Jekọb nwere ụmụ iri na abụọ. Aha ha bụ Ruben, Simiọn, Livaị, Juda, Dan, Naftalaị, Gad, Asha, Ịsaka, Zebulọn, Josef, na Benjamin. Jehova si n’aka Josef, bụ́ otu n’ime ụmụ Jekọb, zọpụta ndị ezinụlọ Jekọb. Ị̀ ma otú o si mee ya? Ka anyi chọpụta n’isiokwu nke iri na anọ.

“Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu; ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe.”​—⁠Matiu 5:44, 45