Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 15

Jehova Echefughị Josef

Jehova Echefughị Josef

Mgbe Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ, Fero, eze Ijipt rọrọ nrọ mmadụ ọ bụla na-enweghị ike ịkọwa ihe ọ pụtara. Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi gwara ya na Josef nwere ike ịkọwara ya ihe nrọ ya pụtara. Fero ziri ozi ozugbo ka a kpọọ Josef.

Mgbe Josef rutere, Fero jụrụ ya, sị: ‘Ì nwere ike ịkọwa ihe nrọ m pụtara?’ Ọ gwara Fero, sị: ‘A ga-enwe nri n’ụba n’Ijipt niile afọ asaa. Afọ asaa ahụ gachaa, a ga-enwekwa ụkọ nri afọ asaa ọzọ. Họrọ onye ma ihe ka o chekwaa nri ka agụụ ghara igbu ndị gị n’oge ahụ a ga-enwe ụkọ nri.’ Fero gwara ya, sị: ‘Ahọrọla m gị. Ị ga-abụ osote m.’ Olee otú Josef si mara ihe nrọ ahụ pụtara? Ọ bụ Jehova mere ka ọ mara ihe ọ pụtara.

Josef ji afọ asaa ahụ e nwere nri n’ụba chekwaa nri. Mgbe afọ asaa ahụ gachara, e nwere ụkọ nri n’ụwa niile otú ahụ Josef kwuru. Ndị mmadụ si n’ebe dị iche iche bịa ka Josef resị ha nri. Mgbe nna ya Jekọb nụrụ na e nwere nri n’Ijipt, o zigara ụmụ ya iri ebe ahụ ka ha gaa zụta nri.

Ụmụ Jekọb bịakwutere Josef ka o resị ha nri. Ozugbo ọ hụrụ ha, ọ matara ha. Ma ha amataghị ya. Ha kpọọrọ ya isiala otú ha mere ná nrọ ahụ ọ rọrọ mgbe ọ ka bụ nwata. Josef chọrọ ịma ma ụmụnne ya hà agbanweela àgwà ọjọọ ha. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: ‘Unu bụ ndị nledo. Unu chọrọ ịma otú ala anyị dị.’ Ha sịrị ya, ‘Mba. Anyị si n’obodo Kenan. Anyị dị ụmụnne iri na abụọ. Otu anwụọla, nke ikpeazụ na nna anyị nọ.’ Josef gwaziri ha, sị: ‘Kpọtaranụ m nwanne unu nke ikpeazụ ahụ, m ga-ekweta ihe unu kwuru.’ N’ihi ya, ha lakwuuru nna ha.

Mgbe ezinụlọ Jekọb richara nri ahụ ha zụtara, Jekọb zigara ụmụ ya Ijipt ọzọ. Na nke ugbu a, ha na nwanne ha ikpeazụ aha ya bụ Benjamin so. Josef lere ụmụnne ya ule. Otú o si mee ya bụ na o tinyere iko ọlaọcha ya n’akpa Benjamin ma kwuo na ụmụnne ya zuuru ya. Mgbe ndị na-ejere Josef ozi hụrụ iko ahụ n’akpa Benjamin, o juru ụmụnne ya anya. Ha rịọrọ Josef ka ọ taa hanwa ahụhụ ọ ga-ata Benjamin

Ugbu a, o doola Josef anya na ụmụnne ya agbanweela. O nwekwaghị ike ijide onwe ya, ya ebewe ákwá, ma kwuo, sị: ‘Abụ m nwanne unu Josef. Nna m, ọ̀ ka dị ndụ?’ Ihe a o kwuru juru ụmụnne ya ezigbo anya. Ọ gwara ha, sị: ‘Unu ewesola ibe unu iwe maka ihe unu mere m. Ọ bụ Chineke zitere m n’ebe a ka unu nwee ike ịdị ndụ. Gaanụ ozugbo kpọta nna m n’ebe a.’

Ha lawara ka ha gaa kọọrọ nna ha ihe ọma merenụ, nakwa ka ha kpọta ya n’Ijipt. Josef na nna ya emechaala biri, n’agbanyeghị na ọtụtụ afọ agaala kemgbe ahụ e rere ya.

“Ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.”​—Matiu 6:15