Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 19

Ihe Otiti Atọ Ndị Mbụ E Tiri Ndị Ijipt

Ihe Otiti Atọ Ndị Mbụ E Tiri Ndị Ijipt

Mgbe ndị Izrel na-agba ohu n’Ijipt, a manyere ha ịrụ ọrụ ike. Jehova zigara Mozis na Erọn ka ha zie Fero ozi a: ‘Hapụ ndị m ka ha gaa fee m n’ala ịkpa.’ Fero ji olu ike gwa ha, sị: ‘Agaghị m eme ihe Jehova kwuru, agakwanụghị m ahapụ ndị Izrel ka ha laa.’ Fero manyekwuru ha ịrụ ọrụ ike. Jehova ga-eme ka Fero mata onye ọ bụ. Ị̀ ma otú o si mee ya? O tiri ndị Ijipt Ihe Otiti Iri. Jehova gwara Mozis, sị: ‘Fero achọghị ige m ntị. N’ụtụtụ, Fero ga-aga n’Osimiri Naịl. Gaa gwa ya na ebe ọ bụ na ọ hapụghị ndị m ka ha laa, Osimiri Naịl ga-aghọ ọbara.’ Mozis gakwuuru Fero otú ahụ Jehova gwara ya. Fero hụrụ ka Erọn kụrụ mkpara ya n’Osimiri Naịl. Osimiri ahụ ghọrọ ọbara ma malite isi ísì, azụ̀ ndị dị n’ime ya nwụkwara. Ndị Ijipt enweghịzi ike ịṅụ mmiri ọ bụla si n’Osimiri ahụ. Ma, ihe ndị a merenụ emeghị ka Fero hapụ ndị Izrel ka ha laa.

Mgbe abalị asaa gachara, Jehova zigara Mozis ọzọ ka ọ gaa zie Fero ozi a: ‘Ọ bụrụ na ị hapụghị ndị m ka ha laa, m ga-eme ka mbàrá ju ebe niile n’ala Ijipt.’ Erọn weliri mkpara ya elu, mbàrá amalite ịpụta ma ju ebe niile n’ala Ijipt. Ha banyere n’ụlọ ndị mmadụ, n’ihe ndina ha, nakwa n’efere nri ha. Ha jukwara ebe niile. Fero gwara Mozis ka ọ rịọ Jehova ka o wepụ ha. Fero kwere nkwa na ọ ga-ahapụ ndị Izrel ka ha laa. N’ihi ya, Jehova mere ka mbàrá ndị ahụ nwụsịa. Ndị Ijipt kpokọtara ha n’ikpo n’ikpo. Obodo Ijipt malitere isi ísì. Ma, Fero jụkwara ịhapụ ụmụ Izrel ka ha laa.

Jehova gwaziri Mozis, sị: ‘Erọn ga-akụ mkpara ya n’ájá dị n’ala, ájá ahụ ga-aghọkwa anwụnta ma ọ bụ ụmụ ahụhụ ndị na-ata ata n’ala Ijipt.’ Ozugbo Erọn mere ihe a a gwara ya, anwụnta eju ebe niile. Ụfọdụ ndị Ijipt gwara Fero, sị: ‘Ihe otiti a si n’aka Chineke.’ Ma, Fero ka jụrụ ịhapụ ndị Izrel ka ha laa.

“M ga-eme ka ha mara; n’otu oge ahụ, m ga-eme ka ha hụ aka m na ike m, ha ga-amarakwa na aha m bụ Jehova.”​—Jeremaya 16:21