Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 20

Ihe Otiti nke Anọ Ruo na nke Itoolu

Ihe Otiti nke Anọ Ruo na nke Itoolu

Mozis na Erọn gakwuuru Fero ka ha zie ya ozi Chineke ziri. Ha sịrị ya: ‘Ọ bụrụ na ị hapụghị ndị m ka ha laa, m ga-eme ka odudu jupụta n’obodo a.’ Odudu nubatara n’ụlọ ndị Ijipt, ma n’ụlọ ndị ọgaranya ma n’ụlọ ndị ogbenye. Ha jupụtara n’obodo ahụ dum. Ma, enweghị odudu dị n’ala Goshen, ebe ndị Izrel bi. Ihe otiti nke anọ ruo na nke iri mekpara naanị ndị Ijipt ahụ́. Fero gwara Mozis, sị: ‘Biko, rịọ Jehova ka o wepụrụ anyị odudu ndị a. Unu nweziri ike ịla.’ Ma, mgbe Jehova wepụrụ ha, Fero ahapụghị ndị Izrel ka ha laa. Fero ọ̀ mụtaranụ ihe n’ihe a merenụ?

Jehova gwara Mozis, sị: ‘Ọ bụrụ na Fero ahapụghị ndị m ka ha laa, m ga-eme ka anụ ụlọ ndị Ijipt rịawa ọrịa ma nwụọ.’ N’echi ya, anụ ụlọ ndị Ijipt bidoro ịnwụ. Ma o nweghị ihe mere anụ ụlọ ndị Izrel. Ma, Fero ka kpọchiri obi ya, o kweghị ka ndị Izrel laa.

Jehova gwaziri Mozis ka ọ gaghachi na nke Fero, wụlie ntụ elu. Mgbe Mozis wụliri ntụ elu, ya aghọọ uzuzu n’ala Ijipt niile. Ntụ ndị ahụ mere ka etuto ọjọọ too ndị Ijipt niile na ụmụ anụmanụ ha. N’agbanyeghị ihe a, Fero ekweghị ahapụ ndị Izrel ka ha laa.

Jehova zigara Mozis ọzọ na nke Fero. Mozis gwara Fero na Jehova kwuru, sị: ‘Ị̀ ka jụrụ ịhapụ ndị m ka ha laa? Echi, akụ́ mmiri ígwé ga-ezo n’obodo a.’ N’echi ya, Jehova zitere akụ́ mmiri ígwé, égbè eluigwe na ọkụ. Enwetụbeghị ụdị akụ́ mmiri ígwé a mbụ n’Ijipt. O bibiri osisi na ihe niile ha kụrụ n’ubi. Ma enweghị ihe mere ndị nke dị n’ala Goshen. Fero gwara Mozis, sị: ‘Biko, rịọ Jehova ka ọ kwụsị akụ́ mmiri ígwé a. Unu nweziri ike ịla.’ Ma ozugbo akụ́ mmiri ígwé ahụ na mmiri ahụ kwụsịrị, Fero ahapụghị ndị Izrel ka ha laa.

Mozis kwuziri, sị: ‘Ugbu a, igurube ga-erichapụ ihe ọ bụla dị n’ubi unu nke akụ́ mmiri ígwé ahụ na-emebighị.’ Ọtụtụ nde igurube richapụrụ ihe niile fọrọ n’ubi nakwa n’elu osisi. Fero rịọrọ Mozis, sị: ‘Biko, rịọ Jehova ka o wepụ igurube ndị a.’ Ma mgbe Jehova wepụdịrị igurube ndị ahụ, Fero ekweghị ege Jehova ntị.

Jehova gwara Mozis, sị: ‘Welie aka gị elu.’ Ozugbo Mozis weliri aka ya, ọchịchịrị gbachiri ebe niile. Ndị Ijipt ahụghị ihe ọ bụla ma ọ bụkwanụ mmadụ ọ bụla ruo abalị atọ. Ma ọchịchịrị agbaghị n’ụlọ ndị Izrel.

Fero gwara Mozis, sị: ‘Gị na ndị gị nwere ike ịla. Ma hapụnụ anụ ụlọ unu.’ Mozis sịrị ya: ‘Anyị ga-akpọrịrị anụ ụlọ anyị ka anyị nwee ike iji ha chụọrọ Chineke anyị àjà.’ Ihe a were Fero ezigbo iwe. Ya agwa Mozis, sị: ‘Si ebe a pụọ. M hụ gị ọzọ, m ga-egbu gị.’

“Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume, n’etiti onye na-ejere Chineke ozi na onye na-adịghị ejere ya ozi.”​—Malakaị 3:18