Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 21

Ihe Otiti nke Iri

Ihe Otiti nke Iri

Mozis gwara Fero na ya agaghị anwa anwa bịa na nke ya ọzọ. Ma tupu ya alawa, ọ gwara Fero, sị: ‘N’etiti abalị, nwa nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt ga-anwụ, malite n’ọkpara Fero ruo n’ọkpara ndị na-eje ozi.’

Jehova gwara ndị Izrel ka ha rie nri pụrụ iche. Ọ gwara ha, sị: ‘Gbuonụ otu nwa ewu ma ọ bụ atụrụ dị otu afọ, teekwanụ ọbara ya n’ọnụ ụzọ ụlọ unu. Hụọnụ ya n’ọkụ, ma rie ya na achịcha na-ekoghị eko. Keenụ ihe n’úkwù unu, yirikwanụ akpụkpọ ụkwụ, dịrịkwanụ njikere ịla. N’abalị a ka m ga-eme ka unu hapụ Ijipt.’ Ì chere na obi atọghị ndị Izrel ụtọ mgbe Jehova gwara ha ihe a?

N’etiti abalị, mmụọ ozi Jehova gara n’ụlọ ndị Ijipt niile. Mmụọ ozi ahụ gburu nwa nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ụlọ ọ bụla a na-eteghị ọbara n’ọnụ ụzọ ya. Ma, e nweghị ihe mere nwa nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ nọ n’ụlọ e tere ọbara n’ọnụ ụzọ ya. E nweghị ezinụlọ ndị Ijipt mmadụ na-anwụghị na ya, ma ezinụlọ ndị ọgaranya ma nke ndị ogbenye. Ma, e nweghị nwa ọ bụla nwụrụ n’ezinụlọ ndị Izrel.

Ọkpara Fero nwụdịrị n’abalị ahụ. Ihe a gbawara Fero obi. Ọ bụ ya mere o ji gwazie Mozis na Erọn ozugbo, sị: ‘Bilienụ, sinụ ebe a pụọ. Gaanụ fee Chineke unu. Chịrịnụ anụ ụlọ unu lawa.’

Ndị Izrel si n’Ijipt pụọ n’oge ọnwa na-agbaru ala. Ha haziri onwe ha n’ezinụlọ n’ezinụlọ, nakwa n’ebo n’ebo. Ha dị nari puku mmadụ isii ma ụmụ nwoke ma ọtụtụ ụmụ nwaanyị ma ụmụaka. Ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Izrel sokwa ha ka ha fewe Jehova. Ndị Izrel emechaala hapụ Ijipt.

N’afọ ọ bụla, ndị Izrel ga na-eri nri ahụ pụrụ iche ha riri n’Ijipt iji na-echeta otú Jehova si napụta ha n’Ijipt. Ihe a na-akpọ ya bụ Ememme Ngabiga.

“N’ihi nke a ka m ji hapụ gị ndụ, ka m wee jiri gị gosi ike m, ka e wee kpọsaakwa aha m n’ụwa dum.”​—Ndị Rom 9:17