Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 22

Ọrụ Ebube Jehova Rụrụ n’Osimiri Uhie

Ọrụ Ebube Jehova Rụrụ n’Osimiri Uhie

Ozugbo Fero nụrụ na ndị Izrel ahapụla Ijipt, o wutere ya na ọ hapụrụ ha ka ha laa. Ọ gwara ndị agha ya, sị: ‘Kwadebenụ ụgbọ ịnyịnya agha m niile, ka anyị chụwa ha. Anyị agaraghị ahapụ ha ka ha laa.’ Fero na ndị agha ya chụụrụ ndị Izrel gawa.

Jehova ji ígwé ojii na-edu ndị ya n’ehihie, jirikwa ọkụ na-edu ha n’abalị. O duuru ha ruo n’Osimiri Uhie, ma gwa ha rụọ ụlọikwuu.

Ndị Izrel hụziri Fero na ndị agha ya ka ha chụ ha na-abịa. Ha nọ n’etiti oké osimiri na ndị agha Ijipt. Ha besaara Mozis ákwá, sị: ‘Anyị na-aga ịnwụ. Ị gaara ahapụ anyị n’Ijipt.’ Ma, Mozis gwara ha, sị: ‘Unu atụla egwu. Unu ga-ahụ otú Jehova ga-esi napụta anyị.’ Ihe a Mozis kwuru gosiri n’eziokwu na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Ọ̀ bụ na ì cheghị otú ahụ?

Jehova gwara ndị Izrel ka ha kwalie. N’abalị ahụ, Jehova mere ka ígwé ojii ahụ dịrị n’etiti ndị Izrel na ndị agha Ijipt. O mere ka ọchịchịrị dịrị n’ebe ndị Ijipt nọ ma mee ka ìhè dịrị n’ebe ndị Izrel nọ.

Jehova gwara Mozis ka ọ kụọ mkpara ya n’osimiri ahụ. Jehova meziri ka oké ifufe fee n’abalị ahụ niile. Osimiri ahụ kewara ụzọ abụọ, e nwee ụzọ n’etiti ya. Ọtụtụ nde ndị Izrel jizi ụkwụ gafee osimiri ahụ n’ala akọrọ. Mmiri ya ghọọrọ ha mgbidi ma n’aka nri ma n’aka ekpe.

Ndị agha Fero chụụrụ ndị Izrel banye n’ala akọrọ ahụ. Jehova meziri ka ndị agha Fero nọrọ n’ọgba aghara. Ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ha malitere ịdapụsị. Ndị agha ahụ tiri mkpu, sị: ‘Ka anyị si ebe a pụọ. Jehova na-alụrụ ha agha.’

Jehova gwara Mozis, sị: ‘Kụọ mkpara gị n’osimiri ahụ.’ Ozugbo ahụ, mmiri ahụ lọghachiri rikpuo ndị agha Ijipt. Fero na ndị agha ya niile nwụrụ. E nweghị otu n’ime ha fọrọ ndụ.

Mgbe ndị Izrel gafechara n’osimiri ahụ, ha bụrụ abụ ha ji too Chineke. Ha bụrụ, sị: ‘Bụkuonụ Jehova abụ, n’ihi na e buliela ya elu nke ukwuu. Ọ tụbara ịnyịnya na onye na-agba ya n’oké osimiri.’ Ka ha nọ na-abụ abụ a, ụmụ nwaanyị ha gbara egwú, kụọkwa ịgbà. Obi tọrọ ndị Izrel niile ụtọ na ha enwerela onwe ha.

“Ka anyị nwee obi ike wee sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?’”​—Ndị Hibru 13:6