Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 23

Ndị Izrel Ekwe Jehova Nkwa

Ndị Izrel Ekwe Jehova Nkwa

Ihe dị ka ọnwa abụọ ndị Izrel hapụchara Ijipt, ha rutere n’Ugwu Saịnaị ma maa ụlọikwuu ha n’ebe ahụ. Jehova gwara Mozis ka ọ gbagote n’ugwu ahụ. Mgbe Mozis gbagotere, ọ gwara ya, sị: ‘M napụtara ndị Izrel. Ọ bụrụ na ha erubere m isi ma debe iwu m, ha ga-abụrụ m ndị pụrụ iche.’ Mozis laghachiri n’ebe ndị Izrel nọ ma kọọrọ ha ihe Jehova kwuru. Olee ihe ndị Izrel kwuru mgbe Mozis gwachara ha ihe a? Ha kwuru, sị: ‘Anyị ga-eme ihe niile Jehova gwara anyị mee.’

Mozis laghachiri n’ugwu ahụ ọzọ. Jehova gwaziri ya, sị: ‘N’ime ụbọchị atọ, m ga-agwa gị okwu. Gwa ndi Izrel ka ha ghara ịbịaru Ugwu Saịnaị nso.’ Mozis gakwuuru ndị Izrel ma gwa ha ka ha dịrị njikere ịnụ ihe Jehova ga-agwa ha.

Mgbe ụbọchị atọ gachara, ndị Izrel hụrụ àmụ̀mà na oké ígwé ojii n’ugwu ahụ. Ha nụkwara ụda oké égbè eluigwe na ụda opi na-adasi ike. Jehova jizi ọkụ gbadata n’ugwu ahụ. Ezigbo ụjọ tụwara ndị Izrel nke na ha mawara jijiji. Ugwu ahụ niile nọ na-akwụ anwụrụ ọkụ ma na-ama jijiji. Ụda opi ahụ na-adasikwa ụda ike. Chineke gwaziri ha, sị: ‘Abụ m Jehova. Unu efela chi ọzọ.’

Mozis gaghachiri n’ugwu ahụ, Jehova enyekwa ya iwu ọ ga-enye ndị Izrel gbasara otú ha kwesịrị isi na-efe ya na otú ha kwesịrị isi na-akpa àgwà. Mozis dere iwu ndị ahụ n’akwụkwọ ma gụọrọ ha ndị Izrel. Ha kwere nkwa, sị: ‘Anyị ga-eme ihe niile Jehova gwara anyị mee.’ Ndị Izrel ekwelanụ Chineke nkwa. Ma, hà ga-emezunụ ya?

“Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”—Matiu 22:37