Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 25

Ndị Izrel Arụọ Ụlọikwuu Ha Ga-anọ Na-efe Chineke

Ndị Izrel Arụọ Ụlọikwuu Ha Ga-anọ Na-efe Chineke

Mgbe Mozis nọ n’Ugwu Saịnaị, Jehova gwara ya ka ọ rụọ ụlọikwuu pụrụ iche nke ndị Izrel ga-anọ na-efe Chineke. Ha ga na-eburu ụlọikwuu a aga ebe ọ bụla ha na-aga.

Jehova gwara Mozis, sị: ‘Gwa ndị Izrel ka ha weta ihe ha ga-ewetali a ga-eji rụọ ụlọikwuu.’ Ndị Izrel wetara ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, nkume dị oké ọnụ ahịa, nakwa ọla. Ha wetakwara ajị anụ, ákwà linin, akpụkpọ anụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ndị Izrel ji obi ha niile weta ihe ndị ahụ ruo mgbe Mozis gwara ha, sị: ‘O zuola. Unu ewetakwala ọzọ.’

Ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị nwere aka ọrụ so rụọ ụlọikwuu ahụ. Jehova nyere ha amamihe ha ji rụọ ya. Ụfọdụ kpara ákwà ma ọ bụ sijie ákwà. Ndị ọzọ doro okwute, jirikwa ọlaọcha rụọ ọrụ, ma ọ bụ tụọ ihe n’osisi.

Ha rụrụ ụlọikwuu ahụ otú Jehova gwara ha rụọ ya. Ha rụrụ ákwà mgbochi mara ezigbo mma. Ha ga-eji ákwà mgbochi a kebie ụlọikwuu ahụ ụzọ abụọ, ya bụ, Ebe Nsọ na Ebe Kasị Nsọ. E nwere igbe ọgbụgba ndụ n’Ebe Kasị Nsọ. Ihe e ji rụọ ya bụ ọlaedo na osisi akeshịa. E nwekwara ihe e ji adọba oriọna e ji ọlaedo rụọ n’Ebe Nsọ, nweekwa tebụl, nakwa ebe ịchụàjà a ga-anọ na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. N’ebe a rụrụ ụlọikwuu ahụ, e nwere efere e ji ọla kọpa mee, nakwa nnukwu ebe a ga-anọ na-achụ àjà. Igbe ọgbụgba ndụ ahụ na-echetara ndị Izrel nkwa ha kwere Jehova na ha ga na-erubere ya isi. Ị̀ ma ihe ọgbụgba ndụ bụ? Ọ bụ nkwa pụrụ iche.

Jehova họọrọ Erọn na ụmụ ya ka ha bụrụ ndị nchụàjà ga na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ. Ha ga na-elekọta ya ma na-achụrụ Jehova àjà n’ebe ahụ. Ọ bụ naanị Erọn, bụ́ nnukwu onye nchụàjà, ga na-abanye n’Ebe Kasị Nsọ. Ọ na-abanye na ya otu ugboro n’afọ iji chụọ àjà maka mmehie nke ya, nke ndị ezinụlọ ya, nakwa nke ndị Izrel niile.

Ndị Izrel rụchara ụlọikwuu ahụ otu afọ ha si n’Ijipt pụta. Ugbu a, ha enweela ebe ha ga na-anọ efe Jehova.

Jehova mere ka ebube ya jupụta n’ụlọikwuu ahụ, ma mee ka ígwé ojii kwụrụ n’elu ya. Mgbe ọ bụla ígwé ojii ahụ kwụ n’elu ụlọikwuu ahụ, ndị Izrel anaghị akwali. Ma ígwé ojii ahụ si n’ụlọikwuu ahụ kwụlie, ha amara na oge eruola ka ha kwalie. Ha na-ewepụsi ihe ndị ha ji rụọ ụlọikwuu ahụ ma kwara ha soro ígwé ojii ahụ na-aga.

“M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: ‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha.’”—Mkpughe 21:3