Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 26

Ndị Nledo Iri na Abụọ

Ndị Nledo Iri na Abụọ

Ndị Izrel hapụrụ Ugwu Saịnaị ma si n’ọzara Peran gaa n’ebe a na-akpọ Kedesh. N’ebe ahụ, Jehova gwara Mozis, sị: ‘Zipụ ụmụ nwoke iri na abụọ, otu onye maka otu ebo, ka ha gaa ledo ala Kenan, bụ́ ala nke m ga-enye ndị Izrel.’ N’ihi ya, Mozis họọrọ ụmụ nwoke iri na abụọ ma gwa ha, sị: ‘Gaanụ Kenan, chọpụtanụ ma ala ya ọ̀ na-eme nri nke ọma. Chọpụtakwanụ ma ndị bi na ya hà siri ike ka ọ̀ bụ na ha esighị ike, ma hà bi n’ụlọikwuu ka ọ̀ bụ n’obodo e wusiri ike.’ Ndị nledo iri na abụọ ahụ gawara Kenan. Jọshụa na Keleb so na ha.

Mgbe ụbọchị iri anọ gachara, ndị nledo iri na abụọ ahụ lọtara. Ha wetara mkpụrụ fig, mkpụrụ pọmigranet, nakwa mkpụrụ vaịn. Ha kwuru, sị: ‘Ala ahụ bụ ezigbo ala, ma ndị bi na ya siri ike. Mgbidi ya dị elu.’ Keleb kwuziri, sị: ‘Anyị ga-emeri ha. Ka anyị gawa ozugbo.’ Ị̀ ma ihe mere Keleb ji kwuo ihe a? Ọ bụ n’ihi na ya na Jọshụa tụkwasịrị Jehova obi. Ma ndị nledo ndị nke ọzọ sịrị: ‘Mba, ndị bi n’ala ahụ toro ogologo, gbaakwa dimkpa. Anyị dị ka ụkpara n’anya ha.’

Mgbe ndị Izrel nụrụ ihe a niile, ike gwụrụ ha. Ha malitere ịtamu ntamu ma na-agwa ibe ha, si: ‘Ka anyị họrọ onye ndú ọzọ, ka anyị laghachikwa Ijipt. Gịnị mere anyị ga-eji gaa ebe ahụ ka e gbuo anyị?’ Jọshụa na Keleb gwara ha, sị: ‘Unu enupụrụla Jehova isi, unu atụkwala egwu. Jehova ga-anọnyere anyị.’ Ma ndị Izrel egeghị ha ntị. Ha chọdịrị igbu Jọshụa na Keleb.

Gịnị ka Jehova mere? Ọ gwara Mozis, sị: ‘N’agbanyeghị ihe niile m meere ndị Izrel, ha achọghị irubere m isi. N’ihi ya, ha ga-anọ afọ iri anọ n’ala ịkpa a, ha ga-anọkwa na ya nwụọ. Ọ bụ naanị ụmụ ha na Jọshụa na Keleb ga-ebi n’ala ahụ m kwere nkwa na m ga-enye ha.’

“Gịnị mere obi ji na-amapụ unu, unu ndị okwukwe nta?”—Matiu 8:26