Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 27

Ha Nupụụrụ Jehova Isi

Ha Nupụụrụ Jehova Isi

Mgbe ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, Kora, Detan, Abaịram, na narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ nupụụrụ Mozis isi. Ha gwara ya, sị: ‘O zuorola unu. Gịnị mere ị ga-eji bụrụ onye ndú anyị, Erọn abụrụ nnukwu onye nchụàjà? Jehova nọnyeere anyị niile, ọ bụghị naanị gị na Erọn.’ Ihe a Kora na ndị òtù ya kwuru were Jehova iwe. O weere ya na ọ bụ ya ka ha na-enupụrụ isi.

Mozis gwara Kora na ndị òtù ya, sị: ‘Bịanụ n’ụlọikwuu echi, werekwanụ ihe e ji agụ ọkụ, tinyenụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ha. Jehova ga-egosi anyị onye ọ họọrọ.

N’echi ya, Kora na narị mmadụ abụọ na iri ise ahụ bịakwutere Mozis n’ụlọikwuu. Ha surere ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ka à ga-asị na ha bụ ndị nchụàjà. Jehova gwara Mozis na Erọn, sị: ‘Sinụ n’etiti Kora na ndị òtù ya pụọ.’

Ọ bụ eziokwu na Kora bịakwutere Mozis n’ụlọikwuu, ma Detan, Abaịram, na ndị ezinụlọ ha ekweghị abịa. Jehova gwara ndị Izrel ka ha si n’ụlọikwuu Kora, Detan, na Abaịram pụọ. Ndị Izrel si ebe ahụ pụọ ozugbo. Detan, Abaịram, na ndị ezinụlọ ha guzooro n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ha. Ala meghere ozugbo ma loo ha niile. Ọkụ si n’ebe Jehova nọ rechapụ Kora na narị ndị ikom abụọ na iri ise nọ n’ụlọikwuu.

Jehova gwaziri Mozis, sị: ‘Nara onye ndú nke ebo nke ọ bụla mkpara ya ma dee aha ya na mkpara ahụ. Ị ga-edekwa aha Erọn na mkpara nke ebo Livaị. Tinyekwa ha n’ime ụlọikwuu, ma mkpara nke onye m họọrọ ga awa okooko osisi.’

N’echi ya, Mozis wepụtara mkpara niile ahụ ma gosi ya ndị isi ahụ. Ma mkpara Erọn wara okooko osisi almọnd, mịakwa mkpụrụ ndị chara acha. Jehova si otu a gosi na ya họọrọ Erọn ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà.

“Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha.”—Ndị Hibru 13:17