Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 28

Ịnyịnya Ibu Belam Ekwuo Okwu

Ịnyịnya Ibu Belam Ekwuo Okwu

Ndị Izrel anọọla n’ala ịkpa ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri anọ. Ha emeriela ọtụtụ obodo ndị siri ike. Ugbu a ha rụrụ ụlọikwuu n’ọzara Moab dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan, oge eruola ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ. Ụjọ tụwara eze ndị Moab aha ya bụ Belak, na ndị Izrel ga-anara ha ala ha. N’ihi ya, ọ kpọrọ otu nwoke aha ya bụ Belam ka ọ bịa na Moab bụọ ndị Izrel ọnụ.

Ma Jehova gwara Belam, sị: ‘Abụla ndị Izrel ọnụ.’ N’ihi ya, Belam jụrụ ịga. Eze Belak kpọrọ ya nke ugboro abụọ ka ọ bịa ma kwe ya nkwa inye ya ihe ọ bụla ọ chọrọ. Belam jụkwara ịga. Chineke gwaziri ya, sị: ‘I nwere ike ịga, ma ọ bụ naanị ihe m gwara gị kwuo ka ị ga-ekwu.’

Belam nọkwasịrị n’elu ịnyịnya ibu ya gawa ebe ọwụwa anyanwụ Moab. O bu n’obi ịbụ ndị Izrel ọnụ n’agbanyeghị na Jehova gwara ya abụla ha ọnụ. Mmụọ ozi Jehova nọchiiri Belam na ịnyịnya ibu ya ụzọ ugboro atọ. Belam ahụghị mmụọ ozi ahụ, ma ịnyịnya ibu ya hụrụ ya. Ịnyịnya ahụ hapụrụ ụzọ tinye isi n’ọhịa. Ịnyịnya ibu ahụ gaziri dagide mgbidi, ụkwụ Belam echigide ná mgbidi ahụ. N’ikpeazụ, ịnyịnya ibu ahụ makpuuru n’etiti ụzọ. Ugboro atọ ahụ mmụọ ozi ahụ nọchiiri Belam na ịnyịnya ibu ya ụzọ, Belam ji osisi tie ịnyịnya ibu ya ihe.

Mgbe mmụọ ozi ahụ nọchichaara ha ụzọ nke ugboro atọ ya, Jehova mere ka ịnyịnya ibu ahụ kwuo okwu. Ịnyịnya ibu Belam jụrụ ya, sị: ‘Gịnị mere i ji na-eti m ihe?’ Belam gwara ya, sị: ‘I mere m ka m yie onye iberiibe. A sị na m ji mma agha, m gaara egbu gị.’ Ịnyịnya ibu ahụ sịrị Belam: ‘Ebuola m gị ọtụtụ afọ, m̀ metụla gị otú a mbụ?’

Jehova meziri ka Belam hụ mmụọ ozi ahụ. Mmụọ ozi ahụ gwara Belam, sị: ‘Jehova gwara gị abụla ndị Izrel ọnụ.’ Belam sịrị ya: ‘Emeela m ihe ọjọọ. M ga-alaghachi.’ Ma, mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: ‘I nwere ike ịga Moab, ma ọ bụ naanị ihe Jehova gwara gị kwuo ka ị ga-ekwu.’

Belam, ọ̀ mụtara ihe n’ihe a merenụ? Mba. Belam mechakwara chọọ ịbụ ndị Izrel ọnụ ugboro atọ, ma na nke ọ bụla, Jehova mere ka ọ gọzie ha. Ndị Izrel mechara lụso ndị Moab agha ma gbuo Belam. A sị na Belam gere Jehova ntị, ì chere na ọ garaghị akara ya mma?

“Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.”​—Luk 12:15