Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 29

Jehova Ahọrọ Jọshụa Ka O Duwezie Ndị Izrel

Jehova Ahọrọ Jọshụa Ka O Duwezie Ndị Izrel

Mozis eduola ndị Izrel ọtụtụ afọ. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-anwụ. Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị gị ga-eduru ndị Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ. Ma, m ga-eme ka ị hụ ya.’ Mozis gwaziri Jehova ka ọ họpụta onye ọzọ ga na-edu ndị Izrel. Jehova gwara ya, sị: ‘Gakwuru Jọshụa, ma gwa ya na ọ bụ ya ga-eduwezi ndị Izrel.’

Mozis gwara ndị Izrel na ya ga-anwụ n’oge na-adịghị anya, nakwa na Jehova ahọrọla Jọshụa ka o duru ha banye n’Ala Nkwa ahụ. Ọ gwaziri Jọshụa, sị: ‘Atụla egwu. Jehova ga-enyere gị aka.’ Obere oge Mozis kwuchara ihe a, ya agbagoro n’Ugwu Nibo, Jehova egosi ya ala ahụ o kwere Ebreham, Aịzik na Jekọb ná nkwa. Mozis nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri abụọ.

Jehova gwara Jọshụa, sị: ‘Gafee Osimiri Jọdan, banyekwa n’ala Kenan. M ga-enyere gị aka otú ahụ m nyeere Mozis. Gbalịa na-agụ Iwu m kwa ụbọchị. Atụla egwu. Ka obi sie gị ike. Na-eme ihe m gwara gị mee.’

Jọshụa zipụrụ mmadụ abụọ ka ha gaa obodo Jeriko mata otú ọ dị. Anyị ga-amatakwu ihe mere ebe ahụ n’isiokwu nke na-esonụ. Mgbe ha lọghachiri, ha gwara Jọshụa ka ha gawa Kenan. N’echi ya, Jọshụa gwara ndị Izrel ka ha kwalie. Ọ gwara ndị nchụàjà ka ha buru igbe ọgbụgba ndụ gawa n’Osimiri Jọdan. Osimiri a tojukwara etoju mgbe ahụ. Ma, ozugbo ụkwụ ndị nchụàjà metụrụ n’osimiri ahụ, ọ kwụsịrị ịsọ, ma taa. Ndị nchụàjà ahụ gaara ije ruo n’etiti osimiri ahụ ma guzoro ruo mgbe ndị Izrel niile gafechara. Ì chere na ọrụ ebube a emeghị ka ndị Izrel cheta ihe Jehova meere ha n’Osimiri Uhie?

Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ. Ugbu a, ha nwere ike ịrụ ụlọ, nakwa obodo ndị mara mma. Ha nwekwara ike ịkọ ugbo, kụọ osisi vaịn, nakwa ubi ndị mkpụrụ osisi juru na ha. N’eziokwu, ala ahụ bụ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ juru na ya.

“Jehova ga na-edu gị mgbe niile, na-enyejukwa mkpụrụ obi gị afọ ọbụna n’ala kpọrọ nkụ.”—Aịzaya 58:11