Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 30

Rehab Ezoo Ndị Bịara Ile Otú Jeriko Dị

Rehab Ezoo Ndị Bịara Ile Otú Jeriko Dị

Mgbe mmadụ abụọ ahụ gara ịmata otú obodo Jeriko dị rutere, ha batara n’ụlọ otu nwaanyị aha ya bụ Rehab. Mgbe eze ndị Jeriko nụrụ ya, o zigara ndị agha ya n’ụlọ Rehab. Rehab zoro mmadụ abụọ ahụ n’uko ụlọ ya, ma gwa ndị agha ahụ ka ha gaa chọọ ha ebe ọzọ. Ọ gwara mmadụ abụọ ahụ, sị: ‘M ga-enyere unu aka n’ihi na m ma na Jehova nọnyeere unu. Amakwa m na unu ga-emeri obodo a. Biko, kwenụ m nkwa na unu ga-echebe ụmụnne m, mama m na papa m.’

Mmadụ abụọ ahụ gwara Rehab, sị: ‘Anyị na-ekwe gị nkwa na e nweghị ihe ga-eme onye ọ bụla nọ n’ụlọ gị.’ Ha sịkwara ya: ‘Kee eriri uhie a na windo gị. Ọ bụrụ na i kee ya, e nweghị ihe ga-eme ụmụnne gị, na mama gị na papa gị.’

Rehab kegidere ụdọ na windo ya, mmadụ abụọ ahụ e si na ya rịtuo. Ha gara zoo n’ugwu abalị atọ tupu ha alaghachikwute Jọshụa. Ndị Izrel mechara gafee Osimiri Jọdan ma jikere ka ha weghara obodo Jeriko. Jeriko bụ obodo mbụ ha meriri. Jehova gwara ha ka ha gbaa obodo ahụ gburugburu otu ugboro n’ụbọchị ruo abalị isii. N’ụbọchị nke asaa, ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe ha gbachara, ndị nchụàjà furu opi ha, ndị agha etisie mkpu ike. Mgbidi obodo ahụ adaruo ala. Ma, ụlọ Rehab nọ ná mgbidi ahụ adaghị. E nweghị ihe mere Rehab na ụmụnne ya, mama ya na papa ya n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi.

“Otú ahụkwa, ọ̀ bụ na e siteghịkwa n’ọrụ kpọọ nwaanyị akwụna ahụ bụ́ Rehab onye ezi omume, mgbe ọ nabatasịrị ndị ozi ahụ nke ọma wee zipụ ha ka ha si ụzọ ọzọ lawa?”—Jems 2:25