Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 31

Jọshụa na Ndị Gibiọn

Jọshụa na Ndị Gibiọn

Akụkọ ihe mere obodo Jeriko bịara gazuo n’obodo ndị ọzọ dị na Kenan. Ndị eze obodo ndị a kpebiri na ha ga-ejikọ aka lụso ndị Izrel agha. Ma ndị Gibiọn mere ihe dị iche. Ha yi uwe kara aka gakwuru Jọshụa ma sị: ‘Anyị si n’obodo dị anya bịa. Anyị anụla ihe banyere Jehova na ihe ndị o meere unu n’Ijipt, nakwa na Moab. Kwenụ anyị nkwa na unu agaghị alụso anyị agha, anyị ga-abụ ndị ohu unu.’

Jọshụa kwetara ihe ha kwuru ma kwuo na ha agaghị alụso ha agha. Mgbe ụbọchị atọ gachara, ọ chọpụtara na ha esighị n’obodo dị anya bịa. Ha si na Kenan. Jọshụa gwara ndị Gibiọn, sị: ‘Gịnị mere unu ji ghaara anyị ụgha?’ Ha gwara ya, sị: ‘Ụjọ tụrụ anyị. Anyị ma na Jehova Chineke unu na-alụrụ unu agha. Biko, unu egbula anyị.’ Jọshụa egbughị ha otú ahụ o kwere ha ná nkwa.

Mgbe obere oge gachara, ndị eze Kenan ise na ndị agha ha yiri ndị Gibiọn egwu na ha ga-alụso ha agha. Mgbe Jọshụa na ndị agha ya nụrụ ya, ha si n’abalị gagide ije chi abọọ ka ha nwee ike ịzọpụta ndị Gibiọn. Ha na ndị Kenan malitere ịlụ agha n’isi ụtụtụ ya. Ka ha na-alụ agha a, ndị Kenan gbara ọsọ. Jehova mere ka akụ́ mmiri ígwé dagbuo ha ebe ọ bụla ha gbagara. Jọshụa gwaziri Jehova ka o mee ka anyanwụ guzoro otu ebe. Gịnị mere o ji gwa Jehova ka o mee otú ahụ ebe ọ bụ na ụdị ihe a emetụbeghị? Ọ bụ n’ihi na Jọshụa tụkwasịrị Jehova obi. Jehova mere ka anyanwụ ghara ịda n’ụbọchị ahụ niile ruo mgbe ndị Izrel meriri ndị eze Kenan na ndị agha ha.

“Ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e; n’ihi na ihe karịrị ihe ndị a si n’aka ajọ onye ahụ.”—Matiu 5:37