Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 34

Gidiọn E Merie Ndị Midian

Gidiọn E Merie Ndị Midian

Ka oge na-aga, ndị Izrel kwụsịrị ife Jehova, fewe chi ọzọ. Ndị Midian zuuru anụ ụlọ ndị Izrel ma mebisịa ihe ndị ha kụrụ n’ubi ruo afọ asaa. Ndị Izrel gara zoo n’ọgba, nakwa n’ugwu ka ndị Midian ghara ịna-enye ha nsogbu. Ha rịọrọ Jehova ka ọ zọpụta ha n’aka ndị Midian. N’ihi ya, Jehova zigara otu mmụọ ozi ka ọ gaa hụ otu nwa okorobịa aha ya bụ Gidiọn. Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: ‘Jehova ahọrọla gị ka ị bụrụ dike n’agha.’ Gidiọn jụrụ ya, sị: ‘Olee otú m ga-esi azọpụta ndị Izrel? O nweghị ihe m bụ.’

Olee otú Gidiọn ga-esi mara na Jehova ahọrọla ya ka ọ zọpụta ndị Izrel? Gidiọn dosara ajị anụ n’ala ma gwa Jehova, sị: ‘N’ụtụtụ, ọ bụrụ na igirigi adaa n’ajị anụ a, ala adịrị kọrọ kọrọ, m ga-ama na ị họrọla m ka m zọpụta ndị Izrel.’ N’ụtụtụ echi ya, igirigi dara n’ajị anụ ahụ ma ala dum adịrị kọrọ kọrọ. Gidiọn rịọkwara Jehova ka o mee ka ajị anụ ahụ naanị dịrị kọrọ kọrọ, ka igirigi daa n’ala ahụ dum. Mgbe Jehova zara Gidiọn ekpere ya, ya edozie ya anya na Jehova ahọrọla ya ka ọ zọpụta ndị Izrel. Ọ kpọkọtara ndị agha ya ka ha gaa lụso ndị Midian agha.

Jehova gwara Gidiọn, sị: ‘M ga-eme ka ndị Izrel merie. Ma, ebe ọ bụ na ị kpọ ọtụtụ ndị agha, unu nwere ike ịna-eche na ọ bụ ike unu ka unu ji merie. Gwa onye ọ bụla ụjọ na-atụ ka ọ lawa.’ N’ihi ya, ndị agha dị puku iri abụọ na abụọ lawara, ya afọdụ puku iri. Jehova gwaziri ya, sị: ‘Ndị agha gị ka dị ọtụtụ. Kpọrọ ha bịa na mmiri ma gwa ha ka ha ṅụọ mmiri. Naanị ndị ị ga-ahapụ bụ ndị na-aṅụ mmiri ma na-ele ma ndị iro ha hà na-abịa.’ Ọ bụ naanị narị ndị agha atọ ṅụrụ mmiri ma na-ele ma ndị iro ha hà na-abịa. Jehova gwara Gidiọn na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole a ga-emeri ndị agha Midian dị otu narị puku na puku iri atọ na ise.

Jehova gwara Gidiọn n’abalị ahụ, sị: ‘Oge ezuola ka unu lụso ndị Midian agha.’ Gidiọn nyere ndị agha ya opi na nnukwu ite e tinyere ọwa ọkụ n’ime ha. Ọ gwara ha, sị: ‘Na-elenụ m anya, meenụ ihe m mere.’ Gidiọn fụrụ opi ya, kụrie ite ya, fegharịa ọwa ọkụ ya, ma tie mkpu, sị: ‘Mma agha Jehova na nke Gidiọn.’ Narị mmadụ atọ ahụ so ya mekwara otú ahụ. Ụjọ tụwara ndị Midian, ha agbakesịa. Jehova tinyere ọgba aghara n’etiti ha, ha amalite ịlụso ibe ha agha. Jehova nyeere ndị Izrel aka ọzọ ha emerie ndị Midian.

“Ka ike karịrị ike nkịtị wee bụrụ nke Chineke, n’abụghịkwa nke si n’aka anyị onwe anyị.”—2 Ndị Kọrịnt 4:7