Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 35

Hana Ekpee Ekpere Ka Ọ Mụta Nwa

Hana Ekpee Ekpere Ka Ọ Mụta Nwa

Otu onye Izrel aha ya bụ Elkena lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Aha ha bụ Hana na Penina. Ma, Elkena hụrụ Hana n’anya karịa Penina. Penina na-akparị Hana mgbe niile n’ihi na ọ mụtaghị nwa, ma Penina nwere ọtụtụ ụmụ. N’afọ ọ bụla, Elkena na-akpọrọ ezinụlọ ya gaa ife Chineke n’ụlọikwuu dị na Shaịlo. Otu ụbọchị ha nọ ebe ahụ, ọ chọpụtara na obi adịghị Hana mma. Ọ sịrị Hana: ‘Biko, ebezila ákwá. Anọ m ya. Ahụrụ m gị n’anya.’

Mgbe e mechara, Hana gara nọpụ iche n’ụlọikwuu ka o kpee kpere. Ọ nọ na-ebesi ákwá ike, na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka. O kwere Jehova nkwa, sị: ‘Ọ bụrụ na i nye m nwa nwoke, m ga-enye gị ya, ọ ga-eji ndụ ya niile jeere gị ozi.’

Ilaị, Nnukwu Onye Nchụàjà, hụrụ Hana ka ọ na-emegharị ọnụ, ma chee na mmanya na-egbu ya. Hana gwara ya, sị: ‘Onyenwe m, o nweghị mmanya na-egbu m. Enwere m ezigbo nsogbu, m na-akọrọ ya Jehova.’ Ilaị chọpụtara na ihe yanwa kwuru adịghị mma. Ọ gwara Hana, sị: ‘Ka Chineke nye gị ihe ị na-achọ.’ Ihe a Ilaị kwuru mere ka obi ruo Hana ala, ya alawa. O rughị otu afọ, Hana amụta nwa ma gụọ ya Samuel. Olee otú i chere obi dị Hana ugbu a ọ mụtara nwa?

Hana echefughị nkwa o kwere Jehova. Ozugbo Samuel tolitetụrụ, ọ kpọtara ya n’ụlọikwuu dị na Shaịlo ka o jewere Jehova ozi. Ọ gwara Ilaị, sị: ‘Lee nwa ahụ m rịọrọ Jehova ka o nye m. Enyefeela m ya Jehova, ọ ga-eji ndụ ya niile jeere ya ozi.’ Elkena na Hana na-aga eleta Samuel kwa afọ, ha na-ewetakwara ya uwe ọhụrụ. Jehova nyere Hana ụmụ nwoke atọ ọzọ na ụmụ nwaanyị abụọ.

“Na-arịọnụ, a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ, a ga-emeghere unu.”—Matiu 7:7