Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 38

Jehova Mere Ka Samsịn Sie Ike

Jehova Mere Ka Samsịn Sie Ike

Ọtụtụ ndị Izrel malitekwara ife arụsị, n’ihi ya, Jehova kwere ka ndị Filistia na-achị ha. Ma, e nwere ụfọdụ ndị Izrel ka hụrụ Jehova n’anya. Otu n’ime ha bụ Manoa. Ya na nwunye ya amụtaghị nwa. Otu ụbọchị, Jehova zitere mmụọ ozi ya ka ọ bịakwute nwunye Manoa. Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: ‘Ị ga-amụta nwa nwoke. Ọ ga-azọpụta ndị Izrel n’aka ndị Filistia. Ọ ga-abụ onye Naziraịt.’ Ị̀ ma ndị bụ ndị Naziraịt? Ha bụ ndị ohu Jehova pụrụ iche. Ha anaghị akpụ isi ha akpụ.

Ka oge na-aga, Manoa na nwunye ya mụtara nwa nwoke ma gụọ ya Samsịn. Mgbe o tolitere, Jehova mere ka o sie ezigbo ike. Samsịn ji aka nkịtị dọgbuo ọdụm. O nwere otu mgbe Samsịn gburu ndị Filistia iri atọ. Ndị Filistia kpọrọ ya asị ma na-achọ ụzọ ha ga-esi egbu ya. Otu abalị ọ nọ na-ehi ụra na Geza, ha gara chere ya n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ka ha gbuo ya n’ụtụtụ. Ma, n’etiti abalị, Samsịn biliri ma bịaruo n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, fopụ ibo ya n’ahụ́ mgbidi. O si n’ebe ahụ buru ibo ahụ n’ubu ya gbagoo n’ugwu dị nso na Hibrọn.

Ndị Filistia mechara gakwuru onye Samsịn chọrọ ịlụ aha ya bụ Delaịla, ma gwa ya, sị: ‘Anyị ga-akwụ gị ọtụtụ puku ọlaọcha ma ị chọpụtara anyị ihe mere Samsịn ji sie ezigbo ike. Anyị chọrọ ijide ya ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ.’ Delaịla kwetara ime ihe a ha gwara ya n’ihi na ọ chọrọ ego ahụ. Samsịn ekwebughị agwa ya ihe mere o ji sie ezigbo ike. Ma, Delaịla nọ na-enye ya nsogbu, ya agwazie ya. Samsịn gwara ya, sị: ‘Akpụtụbeghị m isi mbụ n’ihi na abụ m onye Naziraịt. Ọ bụrụ na a kpụọ m isi, agaghịzi m esi ike.’ Samsịn ekwesịghị ịgwa Delaịla ihe a ọ gwara ya, ka ì chere na o kwesịri ịgwa ya?

Delaịla gwara ndị Filistia ozugbo, sị: ‘Amatala m ihe mere o ji sie ike.’ O mere ka Samsịn nọrọ n’apata ụkwụ ya hiri ụra. Mgbe ọ na-ehi ụra, Delaịla gwara mmadụ ka ọ kpụọ Samsịn isi. Mgbe a kpụchara ya isi, Delaịla kpọrọ ya, sị: ‘Samsịn, ndị Filistia abịala!’ Samsịn ebilie, ma o sizighị ike. Ndị Filistia jidere ya, rụkpọsịa ya anya ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ.

Otu ụbọchị, ọtụtụ puku ndị Filistia zukọtara n’ụlọ chi ha a na-akpọ Degọn na-ekwu, sị: ‘Chi anyị enyela anyị Samsịn. Kpọpụtara anyị Samsịn, ka o meere anyị ihe ọchị.’ Ha kpọpụtara ya ma gwa ya ka o guzoro n’etiti ogidi abụọ. Ha jikwa ya na-eme ihe ọchị. Samsịn rịọrọ Jehova, sị: ‘Biko Jehova, nyetụ m ike, naanị otu ugboro a.’ N’oge ahụ ihe a nọ na-eme, ntutu isi Samsịn etoola ogologo ọzọ. Samsịn ji ike ya niile kwatuo ogidi ụlọ ahụ niile. Ụlọ ahụ niile daruru ala, gbuo ma Samsịn ma ndị niile nọ n’ebe ahụ.

“N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13