Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 39

Eze Mbụ Chịrị Izrel

Eze Mbụ Chịrị Izrel

Jehova nyere ndị Izrel ndị ikpe ka ha na-edu ha, ma ndị Izrel chọrọ eze ga na-achị ha. Ha gwara Samuel, sị: ‘Obodo ndị dị anyị nso nwere ndị eze na-achị ha. Anyị chọkwara eze ga na-achị anyị.’ Samuel ma na ihe a ha kwuru adịghị mma, n’ihi ya o kpere ekpere maka ya. Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị gị ka ha jụrụ. Ọ bụ mụnwa ka ha jụrụ. Gwa ha na ha ga-enwe eze, ma eze ahụ ga-achọ ọtụtụ ihe n’aka ha.’ N’agbanyeghị ihe a a gwara ha, ha sịrị: ‘Anyị achọghị ịma. Ihe anyị chọrọ bụ eze.’

Jehova gwara Samuel na otu nwoke aha ya bụ Sọl ga-abụ eze mbụ ha. Mgbe Sọl gara Rema ka ọ hụ Samuel, o ji mmanụ wụọ Sọl n’isi, si otú ahụ tee ya mmanụ ịbụ eze.

Samuel mechara kpọkọta ndị Izrel ka o gosi ha eze ọhụrụ ha. Ma ha chọrọ Sọl, ha ahụghị ya. Ị̀ ma ihe mere na ha ahụghị ya? Ọ bụ na ọ gara zoo n’ebe a kwasara ihe. Mgbe ha mechara hụ ya, ha kpọpụtara ya ma gwa ya ka o guzoro n’etiti ha. Sọl kacha ndị niile nọ ebe ahụ ogologo, maakwa ezigbo mma. Samuel sịrị ha: ‘Leenụ onye Jehova họọrọ.’ Ndị Izrel gwara eze, sị: ‘Eze, ị ga-adị ndụ!’

Mgbe Eze Sọl malitere ịchị ndị Izrel, ọ na-ege Samuel ntị, na-erubekwara Jehova isi. Ma, o mechara gbanwee. Dị ka ihe atụ, Sọl ekwesịghị ịchụrụ Jehova àjà. Otu ụbọchị, Samuel gwara Sọl ka o chere ka ọ bịa, ma Samuel abịaghị ozugbo. N’ihi ya, Sọl ji aka ya chụọ àjà ahụ. Gịnị ka Samuel mere? Ọ gwara Sọl, sị: ‘I kwesịghị inupụrụ Jehova isi.’ Sọl ọ̀ mụtara ihe n’ihe a o mere?

Mgbe Sọl mechara gaa ịlụso ndị Amalek agha, Samuel gwara ya ka o gbuo ha niile. Ma, Sọl egbughị eze Egag. Jehova gwara Samuel, sị: ‘Sọl ahapụla m, ọ naghịzi ege m ntị.’ Ihe a were Samuel iwe, ya agwa Sọl, sị: ‘N’ihi na ị kwụsịla irubere Jehova isi, ọ ga-ahọrọ onye ọzọ ka ọ bụrụ eze.’ Mgbe Samuel chọrọ ịla, Sọl jidere ya n’ala ala uwe elu ya, ya adọkapụ. Samuel gwaziri Sọl, sị: ‘Jehova adọkapụla alaeze gị.’ Jehova ga-enye ya onye ga-ahụ ya n’anya ma na-erubere ya isi.

“Irube isi dị mma karịa àjà.”​—1 Samuel 15:22