Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 40

Devid na Golayat

Devid na Golayat

Jehova gwara Samuel, sị: ‘Gaa n’ụlọ Jesi. Otu n’ime ụmụ ya nwoke ga-abụ eze ọzọ ga-achị Izrel.’ N’ihi ya, Samuel gara n’ụlọ Jesi. Mgbe ọ hụrụ ọkpara ya, o kwuru n’obi ya, sị: ‘Ọ ga-abụ nwa okorobịa a.’ Ma, Jehova gwara Samuel na ọ bụghị ya. Ọ sịrị Samuel: ‘M na-ahụ ihe dị n’obi mmadụ, ọ bụghị naanị otú ọ dị n’elu ahụ́.’

Jesi kpọpụtara ụmụ ya ndị nwoke isii ọzọ. Ma, Samuel sịrị ya: ‘Jehova ahọrọghị onye ọ bụla n’ime ha.’ Ọ jụrụ ya, sị: ‘Ì nwere ụmụ nwoke ndị ọzọ?’ Jesi sịrị ya: ‘Enwere m otu nwoke ọzọ. Ọ bụ ya bụ nke ikpeazụ. Aha ya bụ Devid. Ọ na-elekọtara m atụrụ n’ọhịa.’ Mgbe a kpọtara Devid, Jehova gwara Samuel, sị: ‘Ọ bụ onye a.’ Samuel wụrụ ya mmanụ n’isi, si otú ahụ tee ya mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị Izrel.

Mgbe oge ụfọdụ gachara, ndị Izrel na ndị Filistia chọrọ ịlụ agha. Ndị Filistia nwere otu dike gbara ezigbo dimkpa na-alụrụ ha agha. Aha ya bụ Golayat. Ọ na-akwa ndị Izrel emo kwa ụbọchị. O ji olu ike kwuo, sị: ‘Kpọpụtanụ onye ga-alụso m ọgụ. Ọ bụrụ na o merie m, anyị ga-abụ ndị ohu unu. Ọ bụrụkwanụ na m merie ya, unu ga-abụ ndị ohu anyị.’

Devid buteere ụmụnne ya, bụ́ ndị agha, nri n’ebe ahụ ndị agha Izrel rụrụ ụlọikwuu. Ọ nụrụ ihe ahụ Golayat kwuru ma kwuo, sị: ‘M ga-alụso ya ọgụ.’ Eze Sọl sịrị ya: ‘Ị ka bụ nwata.’ Devid asị ya: ‘Jehova ga-enyere m aka.’

Sọl nyere Devid ngwa agha ya, ma Devid sịrị ya: ‘Agaghị m ejili ha lụọ agha.’ Devid weere èbè ya gaa n’iyi, họrọ nkume ise na-akwọ mụrụmụrụ ma tinye ha n’akpa ya. Devid agbarazie ọsọ gakwuru Golayat. Golayat agwa ya, sị: ‘Obere nwa a, bịa ebe a. M ga-enye nnụnụ ndị na-efe n’eluigwe na anụ ọhịa anụ gị.’ Ụjọ atụghị Devid. Ọ gwara Golayat, sị: ‘I ji mma agha na ube bịa, ma eji m aha Jehova bịa. Ọ bụghị anyị ka ị na-alụso agha, kama ọ bụ Chineke. Mmadụ niile nọ ebe a ga-amara na Jehova ka mma agha na ube ike. Ọ ga-enyefe unu niile n’aka anyị.’

Devid tinyere otu nkume n’èbè ya, were ike ya niile fegharịa ya gburugburu isi ya ma gbapụ ya. Jehova mere ka nkume ahụ gaa tụọ Golayat n’egedege ihu, ya abamie n’egedege ihu ya, Golayat adaa nwụọ. Mgbe ndị Filistịa hụrụ na Golayat anwụọla, ha agbaa ọsọ. Ị̀ tụkwasịrị Jehova obi ka Devid?

“N’ebe ụmụ mmadụ nọ, ọ gaghị ekwe omume, ma ọ dịghị otú ahụ n’ebe Chineke nọ, n’ihi na ihe niile kwere omume n’ebe Chineke nọ.”​—Mak 10:27