Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 41

Devid na Sọl

Devid na Sọl

Mgbe Devid gbuchara Goloyat, Eze Sọl mere ya onyeisi ndị agha ya. Devid lụrụ ọtụtụ agha, meriekwa na ha. Nke a mere ka ọ bụrụ onye a ma ama. Mgbe ọ bụla Devid si agha lọta, ụmụ nwaanyị na-apụta na-akụ egwú ma na-agba egwú. Ha na-asị: ‘Sọl egbuola puku kwuru puku, Devid egbuokwanụ iri puku kwuru iri puku.’ Sọl bidoro inwere ya anyaụfụ.

Devid ma otú e si akpọ ụbọ nke ọma. Otu ụbọchị Devid na-akpọrọ Sọl ụbọ, Sọl tụrụ ya ube. Devid zere ube ahụ, ya atụọ n’ahụ́ ájá. Sọl gbalịrị ọtụtụ ugboro ka o gbuo Devid. Devid mechara gbapụ gaa zoo n’ọzara.

Sọl kpọọrọ ndị agha dị puku atọ na-achọgharị Devid. Ọ batara n’ọgba ebe Devid na ndị ya na ha so zoro. Ọ maghị na Devid hà nọ ebe ahụ. Ndị ha na Devid so gwara ya, sị: ‘Ihe a bụ ohere i nwere iji gbuo Sọl.’ Devid ji nwayọọ gaa n’ebe Sọl nọ ma bekara uwe elu ya. Ma Sọl amaghị. Obi Devid mechara mawa ya ikpe na ya akwanyereghị eze Jehova tere mmanụ ùgwù. O kweghịkwa ka ndị ya na ya so gbuo Sọl. Mgbe Sọl si n’ọgba ahụ pụta, Devid gwara Sọl na ya gaara egbu ya ma a sị na ya chọrọ. Sọl ọ̀ ga-akwụsịnụ ịchọ igbu Devid?

Mba. Sọl nọgidere na-achọ ụzọ ọ ga-esi gbuo Devid. Otu abalị, Devid na nwa nwanne ya aha ya bụ Abishaị banyere n’ebe Sọl na ndị agha ya nọ. Abna, onye na-eche Sọl nche, nọdị na-ehi ụra. Abishaị sịrị Devid: ‘Ihe a bụ ohere anyị nwere. Ka m gbuo ya.’ Devid sịrị ya: ‘Jehova ga-eme Sọl ihe. Ka anyị were naanị ube ya na ihe mmiri ya pụwa.’

Devid rigooro n’ugwu dị nso dị n’ebe Sọl na ndị agha ya nọ. Devid nọ n’elu ebe ahụ kpọọ Abna, sị: ‘Abna, gịnị mere na i chebeghị eze gị? Olee ebe ihe mmiri Sọl na ube ya dị?’ Sọl matara olu Devid ma sị: ‘I kwesịrị igbu m ma i gbughị m. M ma na ị ga-abụ eze ọzọ ga-achị Izrel.’ Sọl laghachiri n’obí ya. Ma, ọ bụghị mmadụ niile nọ n’ezinụlọ Sọl kpọrọ Devid asị.

“Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere.”—Ndị Rom 12:18, 19