Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 42

Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid

Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid

Ọkpara eze Sọl aha ya bụ Jonatan bụ dike n’agha. Devid kwuru na Jonatan na-efe ọsọ karịa ugo, dịkwa ike karịa ọdụm. Otu ụbọchị, Jonatan hụrụ ndị agha Filistia n’ugwu. Ọ gwara onye na-eburu ya ihe agha, sị: ‘Anyị ga-alụso ha agha ma ọ bụrụ na Jehova enye anyị ihe ịrịba ama. Ọ bụrụ na ha asị anyị gbagote, anyị ga-ebuso ha agha.’ Ndị agha Filistia tiri mkpu, sị: ‘Gbagotenụ ka anyị na unu lụọ agha.’ Jonatan na onye na-eburu ya ihe agha gbagoro n’ugwu, lụso ha agha ma gbuo mmadụ iri abụọ.

Jonatan gaara abụ eze mgbe nna ya nwụrụ, ebe ọ bụ ya bụ ọkpara. Jonatan ma na Jehova ahọrọla Devid ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị ndị Izrel, ma o nweghịrị ya anyaụfụ. Devid na Jonatan ghọrọ ezigbo enyi. Ha kwere ibe ha nkwa na ha ga na-enyere ibe ha aka ma na-agbachitere ibe ha. Jonatan nyere Devid uwe elu ya, mma agha ya, ụta ya na ájị̀ ya iji gosi na ha bụ enyi.

Mgbe Devid gbara ọsọ ka Sọl ghara igbu ya, Jonatan gakwuuru ya ma sị ya: ‘Dị ike ma nwee obi ike. Jehova ahọrọla gị ịbụ eze. Nna m makwa nke ahụ.’ Jonatan bụ ezigbo enyi, ị̀ ga-achọ inwe ụdị enyi a?

E nwere ihe karịrị otu ugboro Jonatan gaara anwụ n’ihi enyi ya Devid. Ọ ma na Eze Sọl nna ya chọrọ igbu Devid, n’ihi ya, ọ sịrị ya: ‘Ọ ga-abụrụ gị mmehie ma i gbuo Devid, o nweghị ihe o mere.’ Ihe a Jonatan kwuru were Sọl ezigbo iwe. Mgbe afọ ole na ole gachara, Sọl na Jonatan nwụrụ n’agha.

Mgbe Jonatan nwụrụ, Devid chọwara nwa Jonatan aha ya bụ Mefiboshet. Mgbe Devid chọtara ya, ọ gwara ya, sị: ‘M ga-elekọta gị ná ndụ gị niile n’ihi na nna gị bụ ezigbo enyi m mgbe ọ dị ndụ. Ị ga-ebi n’obí m, na-erikwa nri na tebụl m.’ Devid echefughị enyi ya Jonatan.

“Na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya. Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.”—Jọn 15:12, 13