Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 43

Eze Devid Emee Mmehie

Eze Devid Emee Mmehie

Mgbe Sọl nwụrụ, Devid ghọrọ eze. Devid dị afọ iri atọ mgbe ahụ. Mgbe afọ ole na ole gachara, ọ nọ n’ụlọ elu ya n’abalị hụ otu nwaanyị mara ezigbo mma. Devid chọpụtara na aha ya bụ Bat-shiba, nakwa na ọ bụ nwunye otu onye agha aha ya bụ Yuraya. Devid ziri ozi ka Bat-shiba bịa n’ụlọ ya. Mgbe ọ bịara, ha kwara iko, Bat-shiba atụrụ ime. Devid zochiri ihe a o mere. Ọ gwara onyeisi ndị agha ya ka o tinye Yuraya n’ihu ihu ebe agha kacha sie ike, ma si n’ebe ọ nọ laa azụ. E gburu Yuraya, Devid alụwazie Bat-shiba.

Ma Jehova hụrụ ihe ọjọọ a niile merenụ. Gịnị ka ọ ga-eme? Jehova ziri otu onye amụma aha ya bụ Netan ka ọ gaa hụ Devid. Netan gwara Devid, sị: ‘E nwere otu ọgaranya nwere ọtụtụ atụrụ, nweekwa otu ogbenye nwere naanị obere nne atụrụ ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. Ọgaranya ahụ weere nne atụrụ nke ogbenye ahụ.’ Mgbe Netan gwachara ya ihe a, Devid were iwe ma sị: ‘Ọgaranya ahụ kwesịrị ọnwụ.’ Netan gwaziri Devid, sị: ‘Ọ bụ gị bụ ọgaranya ahụ.’ Ihe a wutere Devid, ya agwa Netan, sị: ‘Emehiela m Jehova.’ Mmehie a Devid mere wetaara ya na ezinụlọ ya ọtụtụ nsogbu. Jehova tara Devid ahụhụ, ma o gbughị ya n’ihi na o kwuru eziokwu ma dịrị umeala n’obi.

Devid chọrọ ịrụrụ Jehova ụlọ nsọ, ma Jehova họọrọ nwa ya nwoke aha ya bụ Solomon ka ọ rụọ ya. Devid malitere ịkwadebere Solomon ihe ndị ọ ga-eji arụ ya. Ọ sịrị: ‘Ụlọ nsọ Jehova ga-adị ebube. Solomon ka bụ nwata, ma m ga-enyere ya aka ịkwadebe ihe ndị ọ ga-eji arụ ya.’ Devid nyere nnukwu ego a ga-eji arụ ụlọ nsọ ahụ. Ọ kpọtara ndị nwere aka ọrụ. O wetara ọlaọcha na ọlaedo. E sikwa n’obodo Taya na Saịdọn butere Devid osisi sida. Mgbe oge ọnwụ ya na-eru nso, o nyere Solomon akwụkwọ kwuru otú a ga-esi rụọ ụlọ nsọ ahụ. Devid kwuru, sị: ‘Jehova gwara m ihe ndị a m deere gị. Jehova ga-enyere gị aka. Atụla egwu. Ka obi sie gị ike, bidokwa ọrụ.’

“Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.”—Ilu 28:13