Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 44

Ụlọ Nsọ A Rụụrụ Jehova

Ụlọ Nsọ A Rụụrụ Jehova

Mgbe Solomon ghọchara eze Izrel, Jehova jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ka ị ga-achọ ka m nye gị?’ Solomon sịrị ya: ‘Abụ m nwata, o nweghịkwa ihe m ma. Biko, nye m amamihe ka m nwee ike ịna-elekọta ndị gị.’ Jehova sịrị ya: ‘Ebe ọ bụ na ị rịọrọ amamihe, m ga-eme ka ị bụrụ onye kacha nwee amamihe n’ụwa. M ga-emekwa ka ị bụrụ ọgaranya. Ọ bụrụ na i rubere m isi, ị ga-adị ogologo ndụ.’

Solomon malitere ịrụrụ Chineke ụlọ nsọ. O ji ihe ndị kacha mma rụọ ya. Ha bụ ọlaọcha, ọlaedo, osisi na nkume. Ọtụtụ puku ndị nwoke na ndị nwaanyị ma otú e si arụ ụlọ so rụọ ya. A rụchara ụlọ nsọ ahụ mgbe afọ asaa gachara, e nyefeekwa ya Jehova. Ụlọ nsọ ahụ nwere ebe ịchụ àjà, na ihe ndị e ji achụ àjà. Solomon gbunyere ikpere n’ala n’ihu ebe ịchụ àjà ahụ ma kpee ekpere, sị: ‘Jehova, ụlọ nsọ a ebughị ibu, ọ maghịkwa mma ịkpọ ya nke gị, ma biko, nabata ofufe anyị na-efe gị, nụrụkwa ekpere anyị.’ Gịnị ka Jehova mere iji gosi na ụlọ nsọ ahụ dị ya mma, nakwa na ọ nụrụ ekpere Solomon kpere? Ozugbo Solomon kpechara ekpere, Jehova zitere ọkụ, ya erechapụ ihe ndị ahụ e ji chụọ àjà n’ebe ịchụ àjà. Ihe a gosiri na ụlọ nsọ ahụ dị Jehova mma. Mgbe ndị Izrel hụrụ ihe a merenụ, obi tọrọ ha ụtọ.

A ma eze Solomon ama ka onye maara ihe n’Izrel, nakwa n’obodo ndị dị anya. Ndị mmadụ na-abịa akọsara Solomon nsogbu ha ka o nyere ha aka. Eze nwaanyị Shiba bịadịrị jụọ Solomon ajụjụ ndị siri ike ka ọ mara ihe ọ ga-aza ya. Mgbe ọ nụrụ ihe Solomon zara, ọ sịrị: ‘Ekwetaghị m ihe ndị mmadụ gwara m banyere gị. Ma ugbu a, ahụla m na i nwere amamihe karịa otú ha kwuru. Jehova Chineke gị agọziela gị.’ Ihe nọkwa na-agaziri ndị Izrel, obi ana-atọkwa ha ụtọ. Ma n’oge na-adịghị anya, ihe ga-agbanwe.

“Lee! e nwere onye ka Sọlọmọn n’ebe a.”—Matiu 12:42