Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 45

Chineke Ekewaa Alaeze Izrel

Chineke Ekewaa Alaeze Izrel

N’oge niile Solomon na-efe Jehova, udo dị n’ebe niile n’Izrel. Ma, Solomon lụrụ ụmụ nwaanyị si ná mba ọzọ. Ụmụ nwaanyị ndị ahụ na-efe arụsị. Solomon ji nwayọọ nwayọọ soro ha fewekwa arụsị. Ihe a were Jehova iwe. Ọ gwara Solomon, sị: ‘A ga-anapụ ezinụlọ gị alaeze Izrel, kewaa ya abụọ. M ga-enye otu n’ime ndị na-ejere gị ozi nke buru ibu, ezinụlọ gị ga na-achị nke ntakịrị.’

E nwere ihe ọzọ Jehova mere iji mee ka ihe a ọ chọrọ ime doo anya. Otu ụbọchị, otu n’ime ndị na-ejere Solomon ozi aha ya bụ Jeroboam, nọ na-aga n’ụzọ, zute Ahaịja onye amụma. Ahaịja anọrọ n’ihu Jeroboam dọwaa uwe elu ya ụzọ iri na abụọ, ma gwa Jeroboam, sị: ‘Jehova ga-anapụ ezinụlọ Solomon alaeze Izrel, ma kewaa ya ụzọ abụọ. Chịrị iberibe iri n’uwe a, n’ihi na ị ga-abụ eze nke ebo iri.’ Mgbe Eze Solomon nụrụ ihe a, ọ chọwara igbu Jeroboam. Ihe a mere ka Jeroboam gbaga Ijipt. Ka obere oge gachara, Solomon nwụrụ, Rehoboam nwa ya aghọzie eze. Mgbe ahụ ka Jeroboam lọghachiziri n’Izrel.

Ndị okenye Izrel bịara gwa Rehoboam, sị: ‘Ọ bụrụ na i jiri obiọma meso ndị Izrel ihe, ha ga-ejere gị ozi.’ Ma, Rehoboam jụrụ ndị enyi ya ha na ya bụ ọgbọ ihe ọ ga-eme. Ha agwa ya, sị: ‘Mesie ha ike. Nyekwuo ha ọrụ tara akpụ.’ Rehoboam mere ihe a ndị enyi ya gwara ya. O ji obi ọjọọ meso ndị Izrel ihe, ya emee ka ebo iri nke Izrel kwụsị irubere ya isi. Ha emezie Jeroboam eze nke ebo iri. Ebo iri a ka a na-akpọzi alaeze Izrel. A na-akpọ ebo abụọ nke ọzọ alaeze Juda. Ọ bụ ha ka Rehoboam na-achịzi. Otú a ka e si kewaa ebo iri na abụọ nke Izrel ụzọ abụọ.

Jeruselem so n’obodo ndị Rehoboam na-achị. Jeroboam achọghị ka ndị Izrel na-aga ebe ahụ na-efe Chineke. Ị̀ ma ihe mere na ọ chọghị? O chere na ha gaa ebe ahụ, ha ga-ahapụ ya, Rehoboam achịwazie ha. Ọ kpụrụ nwa ehi ọlaedo abụọ, ma, gwa ndị Izrel, sị: ‘Jeruselem dị ezigbo anya. Nọrọnụ ebe a fewe Chineke.’ Ndị Izrel bidoro ife nwa ehi ọlaedo ahụ ma chefuo Jehova.

“Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu? . . . Ma ọ bụ, olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwere?”—2 Ndị Kọrịnt 6:14, 15