Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 46

Jehova Egosi na Ya Bụ Ezi Chi

Jehova Egosi na Ya Bụ Ezi Chi

E nwere ọtụtụ ndị eze ọjọọ chịrị n’alaeze ebo iri nke Izrel. Ma, Ehab so ná ndị eze kacha njọ chịrị Izrel. Ọ lụrụ nwaanyị ọjọọ na-efe Bel. Aha ya bụ Jezibel. Ehab na Jezibel mere ka ọtụtụ ndị Izrel fewe Bel. Ha gbukwara ọtụtụ ndị amụma Jehova. Gịnị ka Jehova mere? O zigara Ịlaịja onye amụma ka ọ gaa zie Ehab ozi.

Ịlaịja gwara Eze Ehab na mmiri agaghị ezo n’Izrel n’ihi ihe ọjọọ ọ na-eme. Ọkọchị kọrọ ruo afọ atọ, ihe ndị a kụrụ n’ubi emeghịkwa. Ihe a mere ka agụụ na-agụgbu ndị mmadụ. Jehova mechara ziga Ịlaịja ka ọ gaa hụ Ehab. Eze Ehab agwa ya, sị: ‘Ị bụ onye nsogbu. Ọ bụ gị kpataara anyị nsogbu niile a.’ Ịlaịja asị ya: ‘Ọ bụghị m mere ka mmiri ghara izo. Ọ bụ gịnwa n’ihi Bel ị na-efe. Anyị ga-amata Chi nke bụ ezi Chi. Gwa ndị Izrel niile na ndị amụma Bel ka ha bịa n’Ugwu Kamel.’

Mgbe mmadụ niile zukọrọ n’ugwu ahụ, Ịlaịja gwara ha, sị: ‘Kpebienụ onye unu ga-efe. Ọ bụrụ na Jehova bụ ezi Chineke, soronụ ya. Ọ bụrụkwanụ Bel, soronụ ya. Anyị ga-eji ihe a mata Chi nke bụ ezi Chi. Ka ndị amụma Bel dị narị anọ na iri ise were ihe ha ji achụ àjà, chụọrọ chi ha àjà, mụnwa ga-achụkwa àjà, kpọkuo Jehova. Chi nke ga-eji ọkụ rechapụ àjà ahụ, ọ bụ ya bụ ezi Chineke.’ Ha niile kwetara ka e mee ihe a o kwuru.

Ndị amụma Bel kwadebere ihe ha ga-eji chụọrọ chi ha àjà. Ha si n’ụtụtụ kpọgide ya ruo n’abalị, na-arịọ ya, sị: ‘Bel, za anyị!’ Mgbe ha kpọgidere Bel, ọ zaghị ha, Ịlaịja ejirizie ha mewe ihe ọchị. Ọ sịrị ha: ‘Kpọsienụ ya ike. O nwere ike ọ na-ehi ụra, chọọkwa ka a kpọtee ya.’ Ndị amụma Bel kpọgidere ya ruo abalị, ma, ọ zaghị ha.

Ịlaịja dọsara ihe o ji achụ àjà n’elu ebe ịchụàjà nke ya ma wụọ ya nnukwu mmiri. O kpeziri ekpere, sị: ‘Jehova, biko, mee ka ndị a niile mara na ọ bụ gị bụ ezi Chineke.’ Ozugbo o kpechara ekpere ahụ, Jehova mere ka ọkụ si n’eluigwe bịa rechapụ àjà ya. Ndị ahụ niile malitere iti mkpu, sị: ‘Jehova bụ ezi Chineke!’ Ịlaịja sịrị ha: ‘Jidenụ ndị amụma Bel. Unu ekwela ka otu onye n’ime ha gbapụ!’ E gburu ndị amụma Bel dị narị anọ na iri ise n’ụbọchị ahụ.

Mgbe Ịlaịja hụrụ obere ígwé ojii si n’osimiri na-apụta, ọ gwara Ehab, sị: ‘Nnukwu mmiri na-achọ izo. Rigoro n’ịnyịnya gị, lawa.’ Ígwé ojii gbachiri, oké ifufe efewe, nnukwu mmiri ezowe. N’ikpeazụ, ọkọchị ahụ kwụsịrị. Ehab gbasiwere ịnyịnya ya ike. Ma, Jehova mere ka Ịlaịja gbara ọsọ gbafere ya. Ma, nsogbu Ịlaịja niile ọ̀ gwụla? Ka anyị chọpụta.

“Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—Abụ Ọma 83:18