Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 47

Jehova Emee Ka Obi Sikwuo Ịlaịja Ike

Jehova Emee Ka Obi Sikwuo Ịlaịja Ike

Mgbe Jezibel nụrụ na Ịlaịja egbuola ndị amụma Bel, ezigbo iwe were ya. O ziri ozi ka e zie Ịlaịja. O ziri ya, sị: ‘Echi, ị ga-anwụ otú ahụ ndị amụma Bel si nwụọ.’ Ezigbo ụjọ jidere Ịlaịja, ya agbaga n’ala ịkpa. Ọ nọzi ebe ahụ kpee ekpere, sị: ‘Jehova, ike agwụla m. Gbuo m ka m nwụọ.’ Ka ọ nọ n’okpuru osisi, ụra buuru ya n’ihi otú ike si gwụchaa ya.

Otu mmụọ ozi bịara kpọtee ya, ma jiri nwayọọ, sị ya: ‘Bilie rie ihe.’ Ịlaịja hụrụ achịcha nọ n’elu nkume na-acha ọkụ na ihe mmiri nke mmiri dị n’ime ya. Ọ tara achịcha ahụ, ṅụọ mmiri, hiwe ụra ọzọ. Mmụọ ozi ahụ kpotekwara ya ọzọ, sị ya: ‘Rie nri, ka i nwee ike inweta ume iji aga ebe ị ga-aga.’ Ịlaịja biliri, ritụkwuo nri. O mechaziri gawa Horeb. O were ya abalị iri anọ ehihie na abalị tupu ya eruo n’Ugwu Horeb. Mgbe o rutere, ọ banyere n’otu ọgba ka o hie ụra. Ma, Jehova kpọrọ ya òkù, jụọ ya, sị: ‘Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme n’ebe a?’ Ịlaịja sịrị ya: ‘Ụmụ Izrel ahapụla ọgbụgba ndụ gị na ha gbara. Ha akwatuola ebe ịchụàjà gị, gbuokwa ndị amụma gị. Ugbu a, ha na-achọkwa igbu m.’

Jehova gwara ya, sị: ‘Pụta, gaa guzoro n’elu ugwu.’ Jehova mere ka oké ifufe fee n’ọgba ahụ. Ihe ọzọ o mere bụ ime ka ala ọma jijiji mee n’ugwu ahụ. Mgbe ala ọma jijiji ahụ kwụsịrị, ọkụ malitere ịgba na ya. N’ikpeazụ, Ịlaịja nụrụ olu dị ala nke jikwa nwayọọ na-agwa ya okwu. O weere uwe ya kpuchie ihu ya, pụta guzoro n’ihu ọgba ahụ. Jehova jụziri ya ihe mere o ji gbaa ọsọ. Ịlaịja gwara ya, sị: ‘Ọ bụ naanị m fọrọ.’ Ma, Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị naanị gị fọrọ. A ka nwere puku mmadụ asaa n’Izrel ndị na-efe m. Gaa tee Ịlaịsha mmanụ ka ọ bụrụ onye amụma ga-anọchi gị.’ Ozugbo Ịlaịja nụrụ ihe a, ya agawa ime ihe Jehova gwara ya. Ì chere na Jehova ga-enyekwara gị aka ma i mee ihe ọ chọrọ ka i mee? N’eziokwu, ọ ga-enyere gị aka. Ugbu a, ka anyị chọpụta otu ihe mere n’oge ahụ ọkọchị kọrọ.

“Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.”—Ndị Filipaị 4:6