Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 48

Ịlaịja Akpọlite Nwa Otu Nwaanyị Di Ya Nwụrụ n’Ọnwụ

Ịlaịja Akpọlite Nwa Otu Nwaanyị Di Ya Nwụrụ n’Ọnwụ

N’oge ahụ ọkọchị kọrọ n’Izrel, Jehova gwara Ịlaịja, sị: ‘Gaa na Zarefat. Otu nwaanyị di ya nwụrụ bi ebe ahụ ga na-enye gị nri.’ Mgbe Ịlaịja batara n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, ọ hụrụ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ ebe ọ na-akpa nkụ. Nwaanyị ahụ dara ogbenye. Ịlaịja rịọrọ ya ka o kunyetụ ya mmiri ka ọ ṅụọ. Mgbe nwaanyị ahụ na-aga ka o kutere ya mmiri, Ịlaịja gwara ya, sị: ‘Biko, wetakwara m achịcha.’ Ma, nwaanyị ahụ sịrị ya: ‘Enweghị m achịcha m ga-enye gị. Ihe m nwere bụ naanị obere ntụ ọka na mmanụ m ga-eji mee nri mụ na nwa m nwoke ga-eri.’ Ịlaịja gwara ya, sị: ‘Jehova kwuru na i meere m achịcha, ntụ ọka na mmanụ gị agaghị agwụ ruo mgbe ọzọ mmiri ga-ezo.’

Nwaanyị ahụ gara meere onye amụma Jehova achịcha. Jehova mezuru ihe ahụ o kwuru. Nwaanyị ahụ na nwa ya nwere ihe ha na-eri n’oge niile ahụ ọkọchị kọrọ. Ntụ ọka ya agwụghị, mmanụ ya agwụghịkwa.

Ma, o nwere ihe ha na-atụghị anya ya merenụ. Nwa nwaanyị ahụ rịawara ọrịa, mechaa nwụọ. Nwaanyị ahụ rịọwara Ịlaịja ka o nyere ya aka. Ịlaịja kuuru nwa ahụ gbagoo n’ọnụ ụlọ ha dị n’elu, nyiwe ya n’ihe ndina ya, ma rịọwa Jehova, sị: ‘Jehova, biko, mee ka nwatakịrị a dịghachi ndụ.’ Ị̀ ma ihe mere ọ ga-eji eju ha anya ma Jehova kpọlite nwa ahụ n’ọnwụ? Ọ bụ n’ihi na enwetụbeghị onye a kpọlitere n’ọnwụ tupu mgbe ahụ. Ihe ọzọ bụ na nwaanyị a na nwa ya nwoke abụghị ndị Izrel.

Ma, Jehova mere ka nwa ahụ dịghachi ndụ. Ịlaịja gwara nwaanyị ahụ di ya nwụrụ, sị: ‘Lee, nwa gị adịla ndụ.’ Obi tọrọ nwaanyị ahụ ezigbo ụtọ, ya agwa Ịlaịja, sị: ‘Ị bụ onye nke Chineke n’eziokwu. Ihe m ji mara bụ na ị na-ekwu naanị ihe Jehova gwara gị ka i kwuo. Ihe ọ bụla i kwuru na-emezukwa.’

“Rịbanụ ama nke ọma na ugoloọma adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghịkwa ewe ihe ubi, ha enweghịkwa ọba ma ọ bụ ụlọ nkwakọba ihe, ma Chineke na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa nnụnụ?”​—Luk 12:24