Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 49

Jehova Egbuo Eze Nwaanyị Ọjọọ

Jehova Egbuo Eze Nwaanyị Ọjọọ

E nwere otu ụbọchị Eze Ehab nọ n’obí ya dị na Jezril, si na windo na-ele ubi vaịn nke otu nwoke aha ya bụ Nebọt. Ehab chọrọ ka ubi vaịn a bụrụ nke ya. Ọ gwara Nebọt ka o resị ya ubi vaịn a. Ma, Nebọt jụrụ n’ihi na Iwu Jehova kwuru ka ndị Izrel ghara ire ala ezinụlọ ha ketara. Ehab ò nwere obi ụtọ na Nebọt mere ihe Iwu Jehova kwuru? Mba. Ihe a o mere were Ehab ezigbo iwe. O meziri ka ọ nọrọ n’ime ụlọ, ọ chọghị ịpụta èzí, ọ chọghịkwa iri nri.

Nwunye Ehab bụ ajọ nwaanyị. Aha ya bụ Jezibel. Ọ gwara Ehab, sị: ‘Ọ bụ gị bụ eze Izrel. Ihe ọ bụla ị chọrọ, ị ga enweta ya. M ga-enye gị ubi vaịn ahụ.’ O dere akwụkwọ ozi nye ndị okenye obodo Nebọt, sị ha boo Nebọt ebubo na ọ kọchara Chineke. Ha mechaa, ha tụgbuo ya na nkume. Ndị okenye ahụ mere ihe Jezibel gwara ha. Jezibel gwaziri Ehab, sị: ‘Nebọt anwụọla. Ubi vaịn ahụ bụzi nke gị.’

Ọ bụghị naanị Nebọt bụ ezigbo mmadụ Jezibel gburu. O gbukwara ọtụtụ ndị hụrụ Jehova n’anya. Jezibel na-ekpere arụsị. O mekwara ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ. Jehova hụrụ ihe ọjọọ niile Jezibel mere. Olee ihe Jehova ga-eme ya?

Mgbe Ehab nwụrụ, Jehoram nwa ya nwoke ghọrọ eze. Jehova zigara otu nwoke aha ya bụ Jihu ka ọ gaa gbuo Jezibel na ndị ezinụlọ ya.

Jihu gbaara ịnyịnya ya gaa Jezril ebe Jezibel nọ. Jehoram agbarakwa ịnyịnya nke ya bịa izute ya. Mgbe ọ hụrụ Jihu, ọ jụrụ ya, sị: ‘Udo ọ̀ dịkwa?’ Jihu gwara ya, sị: ‘Udo ga-adị ma Jezibel nne gị kwụsị ime ihe ọjọọ.’ Jehoram tụgharịrị ụgbọ ịnyịnya ya ka ọ gbalaga. Ma, Jihu gbara ya ụta, ya anwụọ.

Jihu gawaziri n’obí eze Ehab, ebe Jezibel nọ. Mgbe ọ nụrụ na Jihu na-abịa, ya agaa tee ihe n’anya, mezie isi ya, gaa na windo ụlọ elu ya nọrọ na-eche ya. Mgbe Jihu rutere, Jezibel ejiri ọnụ ọjọọ kelee ya. Jihu etie mkpu gwa ndị na-ejere Jezibel ozi guzo Jezibel n’akụkụ, sị: “Tụdatanụ ya!” Ha esi na windo tụdata ya, ya anwụọ.

Jihu mechara gbuo ụmụ Ehab ndị nwoke dị iri asaa. O mekwara ka ndị Izrel kwụsị ife Bel. Ị̀ hụla na Jehova ma ihe niile ndị mmadụ na-eme, ọ ga-egbukwa ndị na-eme ihe ọjọọ n’oge ọ chọrọ?

“A na-eji anyaukwu enweta ihe nketa ná mmalite, ma ọdịnihu ya agaghị abụ nke a gọziri agọzi.”—Ilu 20:21