Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 50

Jehova Enyere Jehoshafat Aka

Jehova Enyere Jehoshafat Aka

Jehoshafat, bụ́ eze Juda bibiri ebe ịchụàjà Bel, bibiekwa arụsị ndị dị n’obodo Juda. Ọ chọrọ ka ndị obodo ya mara iwu Jehova. Ọ bụ ya mere o ji ziga ndị isi na ndị Livaị ka ha gaa n’obodo Juda niile kụziere ndị mmadụ iwu Jehova.

Obodo ndị nọ Juda nso na-atụ ụjọ ịbịa lụso ya agha n’ihi na ha ma na Jehova na-enyere ndị Juda aka. Ha na-ewetadịrị Eze Jehoshafat onyinye. Ma ndị Moab, ndị Amọn na ndị bi na Sia bịara ịlụso ndị Juda agha. Jehoshafat ma na ya kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nyere ya na ndị obodo ya aka. O mere ka ndị niile bi na Juda, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị ma ụmụ ntakịrị bịa na Jeruselem. Ọ nọ n’ihu ha niile kpee ekpere, sị: ‘Jehova, anyị agaghị emeri n’agha a ma ọ bụrụ na i nyereghị anyị aka. Biko, gwa anyị ihe anyị ga-eme.’

Jehova zara ekpere ya. Ọ sịrị ya: ‘Ụjọ atụla unu. M ga-enyere unu aka. Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ, guzoronụ otu ebe, hụ otú m ga-esi zọpụta unu.’ Olee otú Jehova si zọpụta ha?

N’echi ya, Jehoshafat họọrọ ndị na-abụ abụ ka ha bụrụ abụ na-aga n’ihu, ndị agha esoro ha n’azụ. Ha ji ụkwụ si Jeruselem gawa n’ọgbọ agha n’ebe a na-akpọ Tekoa.

Ka ndị ahụ na-abụ abụ ji olu dara ụda na-eto Jehova, Jehova lụụrụ ndị ya agha. O mere ka ndị Amọn na ndị Moab ghara ịma ibe ha, nke mere ka ha malite igburịta ibe ha. O nweghị otu onye n’ime ha fọrọ ndụ. Ma, Jehova zọpụtara ndị Juda, ndị agha ha na ndị nchụàjà. Mgbe mba ndị nọ ha gburugburu nụrụ ya, ha matara na Jehova ka na-azọpụta ndị ya. Olee otú Jehova si azọpụta ndị ya? O nwere ọtụtụ ụzọ o si eme ya. Enyemaka mmadụ adịghị ya mkpa iji zọpụta ha.

“Unu agaghị alụ ọgụ na nke ugbu a. Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ, guzoronụ otu ebe, hụ otú Jehova ga-esi azọpụta unu.”—2 Ihe E Mere 20:17