Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 51

Otu Nwatakịrị Nwaanyị Enyere Dike n’Agha Aka

Otu Nwatakịrị Nwaanyị Enyere Dike n’Agha Aka

E nwere otu nwatakịrị nwaanyị Izrel bi n’obodo Siria. Siria dị anya n’Izrel. Ndị agha Siria dọọrọ ya n’agha laa n’obodo ha, ya ana-agbara nwunye otu onyeisi agha aha ya bụ Neaman odibo. Nwatakịrị nwaanyị a na-efe Jehova, ma, ndị ya na ha bi anaghị efe ya.

E nwere ọrịa ọjọọ Neaman na-arịa. Ọrịa a mere ka akpụkpọ ahụ́ ya jọọ njọ, na-emekwa ka ahụ́ ya na-afụ ya ụfụ mgbe niile. Nwatakịrị nwaanyị ahụ chọrọ ka Neaman gbakee. Ọ gwara nwunye Neaman, sị: ‘Ama m onye ga-emeli ka di gị gbakee. E nwere onye amụma Jehova n’Izrel aha ya bụ Ịlaịsha. Ọ ga-emeli ka di gị gbakee.’

Nwunye Neaman gwara di ya ihe nwatakịrị a kwuru. Neaman chọrọ ime ihe ọ bụla a gwara ya ka o nwee ike ịgbake. Ọ gara na nke Ịlaịsha n’Izrel. Neaman chere na Ịlaịsha ga-eme ya ka onye ukwu. Ma, Ịlaịsha apụtadịghị hụ ya, kama, ọ gwara onye na-ejere ya ozi ka ọ gaa kelee Neaman ma gwa ya ihe ọ ga-eme. Ọ gwara ya, sị: ‘Gaa n’Osimiri Jọdan mikpuo onwe gị ugboro asaa. Ị pụta, ị ga-agbake.’

Ihe a Ịlaịsha mere were Neaman ezigbo iwe. Neaman kwuru, sị: ‘Echere m na ihe onye amụma a ga-eme ka m gbakee bụ ịkpọ aha Chi ya na ifegharị aka ya n’ahụ́ m. Kama, ihe ọ gwara m bụ ka m gaa mikpuo onwe m n’osimiri dị n’Izrel. Anyị nwere mmiri ndị ka ya mma na Siria. Gịnị mere agaghị m aga ebe ahụ mikpuo onwe m?’ Iwe were Neaman, ya esi n’ụlọ Ịlaịsha lawa.

Ndị na-ejere Neaman ozi gwara ya ihe mere ka o chee echiche nke ọma. Ha sịrị ya: ‘È nwere ihe a ga-asị gị mee ka ị gbakee ị na-agaghị eme? Ihe a onye amụma a gwara gị mee esighị ike. Meenụ ya.’ Neaman mere ihe ha kwuru. Ọ gara n’Osimiri Jọdan mikpuo onwe ya ugboro asaa. Mgbe Neaman pụtara na nke asaa ya, ọrịa ya ahụ lara kpamkpam. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya agaghachi na nke Ịlaịsha ka o kelee ya. Ọ gwara Ịlaịsha, sị: ‘Ugbu a ka m matara na Jehova bụ ezi Chineke.’ Olee otú i chere obi dị nwatakịrị nwaanyị Izrel ahụ mgbe Neaman lọtara n’ụlọ ya?

“I mewo ka otuto si n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara pụta.”—Matiu 21:16