Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 52

Ndị Agha Jehova Nọ n’Ịnyịnya Ndị Na-acha Ọkụ Ọkụ

Ndị Agha Jehova Nọ n’Ịnyịnya Ndị Na-acha Ọkụ Ọkụ

Ben-hedad eze Asiria nọgidere na-ebuso ndị Izrel agha. Ma, mgbe ọ bụla ọ chọrọ ibuso ha agha, Ịlaịsha onye amụma na-agwa eze Izrel, ya emee ka a ghara igbu eze Izrel. Ihe a mere ka Ben-hedad chọọ ijide Ịlaịsha. Mgbe ọ chọpụtara na ọ nọ n’obodo Dotan, o zigara ndị agha Siria ka ha gaa jide ya.

Ndị agha ahụ bịara na Dotan n’abalị. Mgbe chi bọrọ, onye na-ejere Ịlaịsha ozi pụtara n’èzí ma hụ ìgwè ndị agha gbara obodo ha gburugburu. Ezigbo ụjọ tụrụ ya, ya etie mkpu, sị: ‘Nna m ukwu, gịnị ka anyị ga-eme?’ Ịlaịsha gwara ya, sị: ‘Ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.’ Ozugbo Ịlaịsha gwachara ya ihe a, Jehova mere ka onye ahụ na-ejere Ịlaịsha ozi hụ ịnyịnya ndị na-acha ọkụ ọkụ na ụgbọ ịnyịnya agha ndị juru n’ugwu ndị dị n’obodo ahụ.

Mgbe ndị agha ahụ chọrọ ijide Ịlaịsha, o kpere ekpere, sị: ‘Jehova, biko mee ka ha kpuo ìsì.’ Ozugbo Ịlaịsha kpechara ekpere a, ndị agha ahụ amaghịzi ebe ha nọ n’agbanyeghị na ha ka na-ahụ ụzọ. Ịlaịsha gwara ha, sị: ‘Ebe a unu nọ abụghị ebe unu chọrọ ịga. Soronụ m, ka m gosi unu onye unu na-achọ.’ Ha sooro Ịlaịsha gaa Sameria, ebe eze Izrel bi.

Ndị agha ahụ mechara mata na ha nọzi na Sameria. Mgbe eze Izrel hụrụ ha, ọ jụrụ Ịlaịsha, sị: ‘Ọ̀ bụ m gbuo ha?’ Ịlaịsha, ò ji ohere a sị ka e gbuo ndị a chọrọ igbu ya? Mba. Ịlaịsha gwara eze, sị: ‘Egbula ha. Nye ha nri ma hapụ ha ka ha laa.’ N’ihi ya, eze meere ha oké oriri, ma hapụ ha ka ha laa.

“Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”—1 Jọn 5:14