Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 53

Otú Jehoyada Si Kata Obi

Otú Jehoyada Si Kata Obi

Jezibel mụrụ otu nwa nwaanyị aha ya bụ Atalaya. Atalaya bụ ajọ nwaanyị ka mama ya. Atalaya bụ nwunye eze Juda. Mgbe di ya nwụrụ, nwa ya nwoke malitere ịchị Juda. Ma, mgbe nwa ya nwoke a nwụrụ, Atalaya mere onwe ya eze nwaanyị, malite ịchị Juda. O gburu onye ọ bụla nwere ike ịnọchi ya n’ezinụlọ eze. O gbudịrị ma ụmụ ụmụ ya ndị nwoke. Onye ọ bụla na-atụ ya ụjọ.

Jehoyada, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, na Jehoshiba nwunye ya ma na ihe ahụ Atalaya na-eme adịghị mma. Ha zoro otu n’ime ụmụ ụmụ Atalaya n’agbanyeghị na Atalaya nwere ike igbu ha ma ọ mata. Aha nwa ahụ bụ Jehoash. Ha zụlitere ya n’ụlọ nsọ.

Mgbe Jehoash dị afọ asaa, Jehoyada kpọkọtara ndị isi niile na ndị Livaị ma gwa ha, sị: ‘Cheenụ ọnụ ụzọ ụlọ nsọ nche, unu ekwekwala onye ọ bụla bata n’ime ya.’ Jehoyada meziri Jehoash eze Juda ma kpuwe ya okpueze. Ndị Juda malitere iti mkpu, sị: ‘Eze, ị ga-adị ndụ!’

Mgbe eze nwaanyị Atalaya nụrụ mkpu ha na-eti, ọ gbaara gaa n’ụlọ nsọ ozugbo. Mgbe ọ hụrụ eze ọhụrụ ahụ, o tiri mkpu, sị: “Izu ọjọọ! Izu ọjọọ!” Ndị isi ahụ jidere ya, kpọpụ ya n’ụlọ nsọ, ma gbuo ya. Gịnịkwanụ banyere ihe ọjọọ o mere ka ndị Juda na-eme?

Jehoyada mere ka ndị Juda na Jehova gbaa ndụ, ha ekwe Jehova nkwa na ọ bụ naanị ya ka ha ga na-efe. Jehoyada mere ka ha kụtuo ebe a na-achụrụ Bel àjà ma kụrisie ihe niile a kpụrụ akpụ dị ebe ahụ. Ọ họpụtara ndị nchụàjà na ndị Livaị ka ha rụwa ọrụ ha n’ụlọ nsọ, ka ndị mmadụ nwee ike ịnọ ebe ahụ fewekwa Chineke. Ọ họpụtakwara ndị ga na-eche ọnụ ụzọ ụlọ nsọ nche ka onye na-adịghị ọcha ghara ịbanye na ya. Jehoyada na ndị isi Izrel akpọrọzie Jehoash gaa n’obí eze ma mee ka ọ nọrọ n’ocheeze. Ihe a mere ka ndị Juda ṅụrịa ọṅụ. Ugbu a Atalaya nwụrụla, e bibiekwa Bel, ndị Juda enwerela onwe ha ife Jehova n’enweghị onye na-enyezi ha nsogbu. Ị̀ hụrụ na otú a Jehoyada si kata obi baara ọtụtụ ndị uru?

“Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ́ ma ha enweghị ike igbu mkpụrụ obi; kama na-atụnụ egwu onye ahụ nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.”—Matiu 10:28