Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 54

Jehova Nweere Jona Ndidi

Jehova Nweere Jona Ndidi

Ndị obodo Ninive dị n’Asiria na-eme ihe ọjọọ. Jehova gwara Jona onye amụma ka ọ gaa Ninive gwa ha ka ha kwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Ma, Jona hapụrụ ebe a sịrị ya gaa, gawa ebe ọzọ. Ọ banyere ụgbọ mmiri bu ndị mmadụ na-aga Tashish.

Ka ụgbọ ahụ nọ na-aga, oké ifufe malitere ife, ụjọ ejide ndị niile nọ n’ụgbọ ahụ. Ha bidoro kpewere chi ha, na-ajụ ya, sị: ‘Gịnị mere ihe a ji eme anyị?’ N’ikpeazụ, Jona gwara ha, sị: ‘Ọ bụ mụnwa kpatara ihe a na-emenụ. Jehova dunyere m ozi, mụ ahapụ ya na-agba ọsọ. Tụbanụ m n’ime oké osimiri a, ka oké ifufe a kwụsị inye unu nsogbu.’ Ndị na-akwọ ụgbọ ahụ jụrụ ịtụba ya ná mmiri ahụ, mana Jona nọgidere na-agwa ha ka ha tụba ya ná mmiri ka oké ifufe ahụ nwee ike ịkwụsị. Mgbe ha tụbara ya, oké ifufe ahụ kwụsịrị.

Jona chere na ya na-aga ịnwụ. Ka ọ nọ na-adakpu n’ala ala mmiri ahụ, o kpere ekpere. Jehova zitere otu nnukwu azụ̀ bịara loo Jona, ma Jona anwụghị. Ọ nọ n’afọ azụ̀ ahụ kpee ekpere gwa Jehova, sị: ‘M na-ekwe gị nkwa na m ga na-erubere gị isi mgbe niile.’ Jehova chebere Jona n’afọ azụ̀ ahụ ruokwa abalị atọ. Mgbe abalị atọ gachara, Jehova mere ka azụ̀ ahụ gbọpụta ya n’elu ala.

Ebe ọ bụ na Jehova echebela Jona, ọ̀ pụtara na ọ gaghịzi aga ozi ahụ o dunyere ya? Mba. Jehova gwara Jona ọzọ ka ọ gaa Ninive. Na nke ugbu a, Jona gara. Ọ gara zie ndị Ninive ihe Jehova ziri ya. Ọ gwara ha, sị: ‘A ga-ebibi Ninive n’ụbọchị iri anọ na-abịanụ.’ Ma, ihe a na-atụghị anya ya mere. Ndị Ninive gere ntị ma kwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Eze ndị Ninive gwara ndị obodo ya, sị: ‘Kpọkuonụ Chineke, onye ọ bụla kwụsịkwa ihe ọjọọ ọ na-eme. O nwere ike hapụzie ibibi anyị.’ Mgbe Jehova hụrụ na ndị Ninive echegharịala, o bibighịkwa ha.

Iwe were Jona na e bibighịzi ndị Ninive. Chebaragodị ihe a echiche: Jehova nweere Jona ndidi, meekwara ya ebere, mana, Jona emereghị ndị Ninive ebere. Kama, ọ pụrụ n’obodo ahụ, gaa nọrọ ọdụ n’okpuru otu osisi ogiri ụgba, na-eche ka ọ hụ ihe ga-emenụ. Osisi ahụ mechara kpọnwụọ, iwe ewee Jona. Jehova gwara Jona, sị: ‘Ị meteere osisi a ebere karịa ndị Ninive. Emeere m ha ebere, ọ bụ ya mere ebibighịzi m ha.’ Olee ihe Jehova ji ihe a na-akụziri anyị? Ọ bụ na ndị Ninive dị mkpa karịa osisi.

“Jehova . . . na-enwere unu ndidi n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.”—2 Pita 3:9