Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 57

Jehova Eziga Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya

Jehova Eziga Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya

Jehova họọrọ Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma ya n’obodo Juda. Ọ gwara ya ka ọ gwa ndị Juda ka ha kwụsị ihe ọjọọ ha na-eme, ma ọ́ bụghị ya, ọ ga-ebibi ha. Jeremaya gwara Jehova, sị: ‘Jehova, abụ m nwata. Agaghị m agwali ha okwu.’ Jehova gwara ya, sị: ‘Ụjọ atụla gị. M ga-agwa gị ihe ị ga-ekwu. M ga-enyere gị aka.’

Jehova gwara Jeremaya ka o were ite ụrọ, kpọkọta ndị okenye Juda ma nọrọ n’ihu ha kụwaa ya. Ọ gwara Jeremaya na ya kụwachaa ya, ya kwuo, sị: ‘A ga-ebibi Jeruselem otú a m si kụwaa ite ụrọ a.’ Mgbe Jeremaya mere ihe ahụ Jehova gwara ya, ezigbo iwe were ndị okenye Juda. Otu onye nchụàjà aha ya bụ Pash-họ tiri Jeremaya ihe ma tinye ya n’ọtọsị. Jeremaya nọgidere n’ọtọsị ahụ chi abọọ. Mgbe chi bọrọ, Pash-họ tọhapụrụ Jeremaya. Jeremaya kwuru, sị: ‘Ihe a akarịala. M ga-akwụsị ikwu gbasara Jehova.’ Mana, ọ̀ kwụsịrị ikwu gbasara Jehova? Mba. Jeremaya bịara chebakwuoro ozi ya echiche ma kwuo, sị: ‘Ozi Jehova dị ka ọkụ na-ere m n’ime ahụ́. Agaghị m akwụsị ikwu gbasara Jehova.’ Jeremaya nọgidere na-agwa ndị Juda ka ha hapụ ihe ọjọọ ha na-eme.

Mgbe ọtụtụ afọ gachara, a bịara nwee eze ọhụrụ na Juda. Ozi Jeremaya nọ na-ezi adịghị ndị nchụàjà na ndị amụma ụgha nọ na Juda mma n’obi. Ha gwara ndị isi, sị: ‘E kwesịrị igbu nwoke a.’ Jeremaya gwara ha, sị: ‘Ọ bụrụ na unu egbuo m, unu gburu onye aka ya dị ọcha. Ihe m na-agwa unu bụ ihe Jehova kwuru, ọ bụghị okwu nke m.’ Mgbe ndị isi nụrụ ihe a o kwuru, ha sịrị: ‘E kwesịghị igbu nwoke a.’

Jeremaya akwụsịghị ikwusa okwu Chineke. Ihe a were ndị isi Juda ezigbo iwe. Ha gwara eze ka e gbuo Jeremaya. Eze agwa ha ka ha mee ya ihe ọ bụla masịrị ha. Ha kpọọrọ Jeremaya gaa tụba n’olulu pọtọpọtọ juru, chee na ọ ga-anọ ebe ahụ nwụọ. Jeremaya bidoro imikpu n’ime pọtọpọtọ ahụ.

Otu nwoke na-eje ozi n’obí eze aha ya bụ Ibed-melek gara gwa eze, sị: ‘Ndị isi atụbala Jeremaya n’olulu. Anyị hapụ ya ebe ahụ, ọ ga-anwụ.’ Eze gwara ya ka ọ kpọrọ ụmụ nwoke iri atọ gaa kpọpụta Jeremaya n’olulu ahụ. Jeremaya ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ kwụsị ikwu gbasara Jehova. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-eme ka Jeremaya?

“Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m; ma onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 10:22